Ihe ndị NYSC na-ekwu gbasara asịsa gọọmentị metutara ego ha

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu onye NYSC akpọrọ Obinna Charles ekwuola na gọọmentị etiti emeteghi ya maka okwu a ha kwuru gbasara mbuli ego a na-akwụ ha.

O kwuru na ọ bụrụ ha ihe nwute na Gọọmentị etiti na-ekwukwazi na ya bụ okwu bụ okpotokpo asị.

Charles kwuru na ego a na-akwụ ha ụgbua ezughị ma ncha ya mere e ji kwesi i buli ya elu.

Ihe ha na-ekwu na soshal midịa

@1MrDecency kwuru na nke a gosiri nkwa emezughị emezu.

Cheta na minista na-ahụ maka arụmọrụ na iwe n'ọrụ bụ Chris Ngige katọrọ akụkọ kwuru na gọọmentị etiti ga-ebuli ụgwọ ọnwa ndị NYSC ma kwụọ na ọ bụ okpotokpo asị.

Ngige kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu n'obodo Obosi nke Idemili dị n'Anambra steeti.

O kwuru na gọọmentị enweghi ike ibuli ụgwọ ọnwa ndị ji otu afọ efe ala nna ha ma ọ bụrụ na ebughị ụzọ ghazie ụgwọ opekatampe nke ndị ọrụ obodo.

O kwuru na ụgwọ ọnwa a na-akwụ ndị ji otu afọ efe ala nna ha nọ na gburugburu opekatampe a na-akwụ ndị ọrụ obodo.

Ngige kwuru na ọ gwụla ego mgbakwụnye maka ime njem dị otu puku na narị ise ka a na-etinye n'elu ụgwọ opekatampe, nke mere ego ndị NYSC ji bụrụ puku iri na itoolu na narị ise bụ ego ole gọọmentị etiti na-akwụ ha ugbua.

Ngige gara n'ihu kwuo na ọ bụ ndị gọvanọ mere na gọọmentị etiti ebulibeghi ụgwọ opekatampe ndị ọrụ obodo site na-enweghi mkpebi ọbụla.

Mana onyeisiala bụ Muhammadu buhari ekwuola na okwukwe ya n'ebe ndị ji otu afọ efe ala nna ha nọ ka bụ ihe siri ike.

Nke a bụ mgbe ọ na-abatara ụfọdụ ndị a ụnyaahụ n'ụlọ ya dị na Daura nke Katsina steeti n'emume Eld-el-Kabir nke na-aga n'ihu ugbua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: