You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
NYSC: Mmadụ 9 anwụọla ebe ha na-efe ala nna ha
Onụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Taraba a kpọrọ David Missal, ekwuola na ọ bụ eziokwu na ndị na-efe ala nna ha ruru 9 nwụrụ na mmiri dị na Taraba steeti.
O kwuru na kemgbe ihe mberede a mechara, na ọ bụ ozu mmadụ asaa ka a gụpụtarala na mmiri ahụ.
Missal kwukwara na ihe mere ndị a na-efe ala nna ha ji nwụọ ebe ha na-egwu mmiri bụ na mmiri malitere ito na-akaghị aka.
@IsimaOdeh kwuru na ọ bụ ihe nwute na ihe ruru mmadụ 9 ndị NYSC nwụrụ na ya bụ ihe mberede.
Ebe @MKIbrahimSenior kwuru na ọ dị mkpa ka akụziere ndị na-efe ala nna na-aga ebe mmiri dị etu esi egwu mmiri.
O kwuru na akụkọ ruru ha aka kwuru na ndị na-efe ala nna ha ruru mmadụ 22 gara nlegharị anya na mmiri Mayo-Selbe dị na Taraba tupu ihe mberede a emee.
"A gwakwara anyị na ka ha nọ na-egwu mmiri, mmiri ahụ malitere ito na-akaghị aka."
"Anyị agụpụtala ozu mmadụ asaa ma na-achọ ozu mmadụ abụọ fọrọnụ."
N'otu aka ahụ, onyeisi ụlọọrụ NYSC bụ Florence Yaakugh kwetekwara na ihe mberede a mere.
O kwuru na ya bụ ihe mberede wutere ya na ndị otu ya nke ukwuu ma kwekwa nkwa na ha ga-akpọpụta aha ndị niile ihe a metụtara n'ọha.
N'ọnụ ya, ''ihe mberede a e tinyela anyị niile n'iru uju."