Okorocha: Ndị ntoroọbịa nwere ikike ịhọpụta onye ga-achị

Aka na-achị Imo steeti bụ Rochas Okorocha agwala ụmụafọ Igbo na ọ bụrụ na Buhari merie na ntuliaka afọ 2019 na ọ bụ mmeri nye ndị Igbo.

Okorocha kwuru nke a n'ọgbakọ ya na ndị ntoroọbịa na ụmụnwaayị pati APC nke mpaghara ọwụwaanyanwụ nwere na ngwụcha izuụka.

O kwuru na ndị Igbo na-aghọtaghe ụdịdị mmadụ Buhari, kwuo na Buhari bụ ezigbo mmadụ, ezigbo onye ndu obi ruru ala.

Ọ gara n'ihu gwa ndị ntoroọbịa na ndị nne na ikike ịhọpụta ọnye ọchịchị dị ha n'aka dịka ọ kpọkuru ha ka ha saa anya na mmiri na ntuliaka dị n'ihu.

N'okwu ya " Mmeri Buhari bụ mmeri ndị Igbo, agaghị achọ anyị achọ n'ọgbọ ndọrọndọrọ ọchịhchị nke Naịjirịa.

Ka anyị mezie ihe anyị mebiri n'afọ 2015 site na ndị ntoroọbịa na ndị nne ime ihe ha kwesiri ha ime."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: