NYSC: Mmadụ 9 anwụọla ebe ha na-efe ala nna ha

Ndị NYSC

Ebe foto si, @nysc_ng

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị Naịjirịa na-ekwu na ife ala nna adịchaghị oke mkpa tụmadị ọbụrụ na a ga-akọga ụmụ mmadụ na steeti na abụghị nke ha.
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Taraba a kpọrọ David Missal, ekwuola na ọ bụ eziokwu na ndị na-efe ala nna ha ruru 9 nwụrụ na mmiri dị na Taraba steeti.

O kwuru na kemgbe ihe mberede a mechara, na ọ bụ ozu mmadụ asaa ka a gụpụtarala na mmiri ahụ.

Missal kwukwara na ihe mere ndị a na-efe ala nna ha ji nwụọ ebe ha na-egwu mmiri bụ na mmiri malitere ito na-akaghị aka.

@IsimaOdeh kwuru na ọ bụ ihe nwute na ihe ruru mmadụ 9 ndị NYSC nwụrụ na ya bụ ihe mberede.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Ebe @MKIbrahimSenior kwuru na ọ dị mkpa ka akụziere ndị na-efe ala nna na-aga ebe mmiri dị etu esi egwu mmiri.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

O kwuru na akụkọ ruru ha aka kwuru na ndị na-efe ala nna ha ruru mmadụ 22 gara nlegharị anya na mmiri Mayo-Selbe dị na Taraba tupu ihe mberede a emee.

Aha onyonyo, 'Mberede nwa m egbuola m na ndụ'

"A gwakwara anyị na ka ha nọ na-egwu mmiri, mmiri ahụ malitere ito na-akaghị aka."

"Anyị agụpụtala ozu mmadụ asaa ma na-achọ ozu mmadụ abụọ fọrọnụ."

Ihe osise na-egosi ebe ihe mberede a mere

N'otu aka ahụ, onyeisi ụlọọrụ NYSC bụ Florence Yaakugh kwetekwara na ihe mberede a mere.

O kwuru na ya bụ ihe mberede wutere ya na ndị otu ya nke ukwuu ma kwekwa nkwa na ha ga-akpọpụta aha ndị niile ihe a metụtara n'ọha.

N'ọnụ ya, ''ihe mberede a e tinyela anyị niile n'iru uju."

Akụkọ ndị ga-amasị: