You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Johesu akpọghachila ndị ọrụ ahụike
Otu jikọrọ ndị ọrụ ahụike na Naijiria bụ Joint Health Sector Union (Johesu) na bekee agwala ndị otu ha ka ha lọghachi n'ọrụ echi bụ ụbọchị mbụ ọnwa Juunu.
Johesu kwupụtara nke a ụbọchị taa ka ha mechara ọgbakọ ndị isi ha n'Abụja.
Akwụkwọ ozi ha depụtara oge ha mechara ọgbakọ ahụ kwuru sị, "Dịka ndị isi nwechara mkparịtaụka, ha kwekọrịtara ikwụsị taa bụ Mee 31 n'ihi obi ọmịiko ndị otu anyị nwere n'ahụhụ nke dị ọha Naijiria na-ata ya na iji nye ohere maka mkparịtaụka maka udo nke ga-ebido ụbọchị Juunu 4".
Ha katọrọ gọọmentị maka ịhapụ imejupụta ọchịchọ ha.
Cheta na Johesu gbara abụbọ ọrụ abalị iri anọ na atọ (43) gara aga.