You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ejidela ndị otu Biafra Zionist Federation wakporo ụlọọrụ Gọvanọ Enugwu
Anwuchiri mmadụ iri abụọ bụ ndị sị na ha bu ndị so n'otu chọrọ Biafra nakwa onyeisi ha a na-akpọ ọkaiwu Benjamin onwuka n'Enugwu ụnyaahụ ka ha gara ị wakpo isi ụlọ gọọmentị n'Enugwu, ndị uweojii kwuru.
Ndị uweojii kwuru na anwụchiri ndị a mgbe ha gara iji aka ike banye na ogige ụlọ gọọmentị Enugwu.
Onye mgbasa ozi ndị uweojii n'Enugwu bụ DSP Ebere Amaraizu kwuputara na ndị ahụ ejidere bụ ndị kpọrọ onwe ha 'Biafra Zionists Federation'.
Amaraizu kwuru na ndị ahụ malitere ngagharị iwe site na Bisala road dị n'Enugwu were gaa na obi gọvanọ Enugwu ebe ndị uweojii na ndị otu nchekwa ndị ọzọ nwụdezịrị ha.
Ya bụ nwa amadị mere onwe onye isi ndị zionists ahụ bụ Benjamin onwụka bụ onye ka na azara ọnụ ya n'ụlọ ikpe maka ebubo mile eboro ya oge gara aga,
Ha gunyere, ịgbụ mmadụ, izu ohi nakwa ibu egbe na ejighị ịkịkere ị bu ya.
Amaraizu sịrị na ndị ahụ nozị na-aka ndị uweojii ebe nyocha na-aga n'ihu.