Ụlọikpe atụọla Jolly Nyame nga maka mmerụaka

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụlọikpe ukwu nọ n'Abuja atụọla onye chịbụrụ Taraba state bụ Rev Jolly Nyame nga afọ iri na anọ maka imefu ego karịrị nde naira 250.

Ọkaikpe Jọstis Adebukola Banjoko mara Nyame ikpe maka 'imefu of nde naira N165 n'ụzọ akwụghị ọtọ'.

Ngalaba gọọmentị na-ebu agha megide mpụ na mmerụaka bụ EFCC n'aha ịchafụ kwupụtara nke a n'igwe okwu Twitter taa.

Jolly Nyame, onye otu PDP, chịrị Taraba steeti dịka Gọvanọ bido n' ọnwa Mee 29, afọ 1999 rue Mee 29, afọ 2007.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: