You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mere eji kpụpụ nwa Zuma ụlọikpe na South Africa
Ka ndị mba Saụt Afrịka na-enyocha onye bụbu onyeisiala ha bụ Jacob Zuma na nwa ya nwoke, ajụjụ bụ 'ụdịrị ihe a a ga-emenwu na Naịjirịa?'
Duduzane bụ nwa Jacob Zuma na-aga ụlọikpe ebe ọ ga-azara ọnụ ya gbasara ebubo mpụ na nrụrụaka ọkachasị nke metụtara ezinaụlọ Gupta bụ ndị a ma ama na mba Saụt Afrịka.
E nyere Duduzane, dị afọ 34, ihe Bekee kpọrọ 'bail', n'agbanyeghị na a tụrụ ya ịga n'ụkwụ ya oge e dubatara ya n'ụlọikpe.
N'afọ 2017, Duduzane gwara BBC na aka ya dị ọcha, na ọ naghị eme mpụ na nrụrụaka.
Ka ọtụtụ afọ gafere, Duduzane na-agọ ụkwụ ya na aka ya na o jighị ọnọdụ ya dịka 'nwa onyeisiala' etinye ego n'ezinaụlọ Gupta.
@AdvBarryRoux jụrụ ma ịtụ ya ịga a dị mkpa?
Ebe @vuyo_ro na-ajụ ihe kpatara a ga-eji nwụchie ya ebe ndị kpasara ha oke nke 'apartheid' na-agagharịrị onwe ha.
Isi na isi: Naịjirịa na Saụt Afrịka
- E nwebeghị onye chịburu Naịjirịa a pụtara n'ihu ọha bo ebubo mpụ na nrụrụaka, ma ya fọdụzịa ịkpọpụ ụlọikpe.
- Zuma bụ naanị onye chịburu Saụt Afrịka e borola ebubo mpụ na nrụrụaka ma kpụpụ ya ụlọikpe.
- A bịa na Naịjirịa, ụmụ ndị bụbu onyeisiala enwebeghị nke a kpọtụrụla aha ya n'ihe gbasara nrụrụaka, mana Duduzane nwa Zuma na-azara ọnụ ya n'ụlọikpe maka nkea.
Na ụlọikpe kwuru ka a hapụ ya na 'bail' emeghị ka ọ laa na nta, maka na ọ ga-alaghachị n'ụbọchị 12 nke Julaị afọ a, ịzara ọnụ ya maka onye nwụrụ oge ụgbọala 'Porsche' ya na 'minibus' bụ ndị mmadụ sukọtara n'afọ 2014.