You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Uru na ọghọm dị n'iwu ịkpachi ego nrụrụaka Buhari hiwere - Ọkaiwu
Ọkaiwu Chukwuemeka Eze kwuru na ọ dị mma ime iwu ịkpachi akụ ndị nọ n'ọkwa gọọmenti a na-ebo ebubo mmerụaka-nke a kpọrọ Executive Order on Corruption" mana ọ bụ ụlọomeiwu ka ọ dịrị ime nke a.
Onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari binyere aka n'akwụkwọ ka gọọmenti nwee ikike ịkpachi akụ na ihe onwunwe ọrụ gọọmentị maọbụ onye nọ n'ọkwa ọchịchị a na-arụ aka imefu ego ala Naijiria ruo mgbe ikpe gbasara ya biri n'ụlọikpe.
O kwuru na iwu ọhụrụ ga-anapụ ndị tinyere aka na mpụ akụ ha kpatara n'ụzọ akwụghị ọtọ, iji gbochie iji ya eduhie ndị na-eme nnyocha maọbụ ikpe.
Dịka Ọkaiwu Eze, onye bụ onyenkuzi mahadum na 'Nasarawa University,' siri kọwa, e nwere uru na ọghọm dị n'iwu ọhụrụ ahụ ma ọ bụrụ na gọọmenti jichi ego a na-arụaka na ọrịrị ego ọha tupu e bie ikpe ya.
Lee ụfọdụ ndị ọ gụpụtara:
Uru dị n'iwu ịkpachi ego nrụrụaka
1. Ka onye eboro ebubo nrụrụaka gbaa mbọ ka ekpe ikpe ya ngwangwa
2. Ọ ga-ewetu aka etu ndị mmadụ si ezu ego Naijiria
3. Ọ ga-ewelatara gọọmenti ego ha na-emefu ịchụgharị ndị a na-enyo enyo na ha buru ego ọha
Ọghọm dị na ya
1. Ndị mmadụ ga-agbagha ya n'ụloikpe si na o megidere iwu Naijiria
Ọkaiwu Eze kwuru na "ọ bụ ihe kwesiri ka ụlọomeiwu Naijiria (National Assembly) kwesiri ime iwu, ọ bụghị 'executive order."
2. Ọghọm ọzọ bụ na e nwere ike jichie akụ onye aka ya dị ọcha.