You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ọtụtụ mmadụ jiri nwụọ na mwakpo ndị oyi egwu na Borno
Ndị na-eyi ndụ egwu wakporo otu obodo akpọrọ Mailari dị na Borno steeti nke Naịjirịa bụ ebe ha gburu ọtụtụ ndị mmadụ.
Akụkọ kwuru na ọnụọgụgụ ndị egburu edochaghị anya dịka onye ọrụ nchekwa ọdịnala kwuru na ọ bụ mmadụ isii kama onye hụrụ ka ihe ji mee kwuru na ọ bụ mmadụ iri na itoolu.
Otu onye hụrụ ka ihe ji mee bụ Abatcha Umar kwuru na ndị a wuchiri n'ụgbọala ha n'elekere abụọ nke isi ụtụtụ n'ụbọchị ụka, malite gbawa egbe ma na-atụkwa ogbunigwe.
O kwuru na ọ maghị ma ndị a ọ bụ ndị Boko Haram ka ọ bụ ndị akpọrọ 'Islamic State in West Africa Province' n'olu bekee.
O kwuru na ọ gụtara ozu mmadụ iri naitoolu nke gụnyere nwanne ya nwoke, mana onye ọrụ ahụike kwuru na ihe ruru mmadụ iri isii na atọ nwrụrụ.
Umar kwuru na ndị oyi ndụ egwu a anọọla na gburugburu ebe obodo kamgbe abalị atọ tupu ha na-eme mwakpo a.
Otu onye ọzọ aha bụ Aisami Grema kwuru na ndị uweojii nọ nso ebe ahụ emegharịghị ahụ n'ibuso ndị a agha.
Cheta na Boko Haram malitere ibu agha na Naịjirịa kamgbe afọ 2009.