You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Na Borno, ogbunigwe egbuola ihe karịrị mmadụ 17
Ndị oji-ogbunigwe-agbagbu-onwe abụọ egbuola ihe karịrị mmadụ iri na asaa ma merụọ iri ise ahụ n'ime otu ahịa n'obodo Konduga dị na Borno steeti.
Ha wakporo ahịa azụ na-ekwo ekwo n'obodo Konduga nke dị nso na ndịda Maiduguri.
Ndị hụrụ ka o si mee kwuru na mkpamkpa a dị ezigbo egwu, ebe ndị ọrụ gbatagbata na Borno steeti kwuru sị na ndị mgbagbuonwe abụọ ahụ sokwa na ndị nwụrụ.
Is'haq Khalid bụ onye ntaakụkọ BBC na-akọwa na na-agbanyeghị na onwebeghị onye kwuru na ọ bụ ha kpara mkpamkpa a, ka o siri mee na-arụ aka na ọ bụ akaọrụ ndị Boko Haram na-enye nsogbu na mpaghara ahụ.
Ebugala ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ.