You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ohaneze adọọla Ipob aka na ntị maka ịbu ọnụ
Ngalaba na-ahu maka ọdịmma Igbo niile bụ Ohaneze adọọla otu chọrọ ka ekewapụta mba Biafra site na Naịjirịa bụ Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) ka ha kwụsị ịkatọ ha maọbụ ịbụ ha na ndịisi ha ọnụ.
Ohaneze kwuru nke a na akwụkwọ mgbasa ozi ọnụ onye ndụmọdụ onyeisi John Nnia Nwodo bụ Emeka Attamah zipuru ụnyaahụ.
Attamah kwuru na ọ bụ ihe ọjọọ na ndị Ipob na eji ọnụ awakpo Ohaneze Ndigbo ohere ọbụla ha nwetere.
Ọ sị na-agbanyeghị na Nwodo na-agba mbọ ịhụ na ọnaghị ekwugide Ipob maọbụ mekpa ha ahu, mana ihe Ipob chọrọ bụ ịkatọ ya na Ohaneze.
O kwuru na agbanyeghị na Ohaneze tinyere ọnụ n'atụmatụ Egwu Eke nke atọ ndịagha Naịjirịa chọrọ ime (ha sị na ha katọrọ atụmatụ a ọfụma site n'ọnụ Uche Achi-Okpaga bụ ode akwụkwọ Ohaneze) Ipob gakwara n'ihu na-ebo ha na onweghi ihe ha kwuru banyere ya.
Ohaneze kwuru na atụmatụ Egwu Eke abụghị ihe kwesiri ime n'Igbo ugbua.
Ohaneze kwuru na ha achọghị ka ha na Ipob gwụọ ọnụ makana ọbụghị ihe ga-adịrị Igbo mma.
"Ndị Igbo isi ha pụtara kwesiri itinye ọnụ n'okwu a hụ na-adọrọ Ipob aka na ntị.
Cheta na Ipob na Ohaneze nwere nkwekọrịta ịhụ na udo dị n'etiti ha, mana Ipob kagbụrụ ya ma kwuo na ha chọpụtara na ọbụghị ihe ha chọrọ ka Ohaneze chọrọ.
Lee ihe otu n'ime ọnụ na ekwuru Ipob bụ Innocent Chukwudi Peace kwuru banyere nkagbu ahụ ha mere nkwekọrịta ahụ.