You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kofi Annan: Ihe asaa ị maghị maka Dike Afrịka
Kofi Annan, onye chịburu otu mbaụwa a kpọrọ 'United Nations' (UN), ma bụrụkwa okpeudo a ma ama na mbaụwa, nwụrụ taa bụ Satọde, Ọgọst 18.
Ndị ndu mba dị iche iche n'ụwa gbaa gburugburu na-ekwupụta obi mwute ha maka ọnwụ ya, ma na-ebunye ezinaụlọ ya ụkpa ekele maka ezi ọrụ niile ọ rụrụ n'ụwa tupu ọ laa mụọ.
Lee ihe ndị ị maghị maka dịke Afrịka ji eje mba:
1. Ọ bụ onye isi ojii Afrịka mbụ chịrị dịka ọnyeisi UN.
Ọchịchị ya sochiri nke Boutros Boutros-Ghali, onye Afrịka chịrị UN naanị agba mbụ, ma chịa agba abụọ bụ afọ ise, afọ ise.
2. Ọ bụ ejima. Ejima nwanne ya nwanyị bụ Efua nwụrụ n'afọ 1991.
3. O ritere nturuugo 'Nobel' nke ya na otu UN so nweta n'afọ 2001 maka nhazi o mere n'otu ahụ dịka otu na-akpa udo.
4. Nwaanyị mbụ ọ lụrụ bụ onye Naijiria, nwaada Yoruba a kpọrọ, Titi Alakija.
Ha mụtara ụmụ abụọ; nwaanyi, Ama na nwoke, Kojo. Mana ha gbasara n'afọ 1983 ka afọ iri na asatọ gachara. Ọ lụrụ onyeọcha, Nane, onye mba Swiden.
5. O nwere otu ọkwọ ụgbọala bụkwa onye ya na ya bụ 'ahụghị na erighị' rue Ọgọstụ 18, 2018, ụbọchị ọ nwụrụ.
6. Kofi Annan bụ onyeisi otu 'Elders' otu na-agba mbọ maka udo na ikike dịrị onye nke Nelson Mandela hibere.
7. Agbanyeghị na Kofi Annan bụ dike e ji aha ya a ga mba, o nwere ebe o si rie mperi mgbe ọ dị ndụ.
A na-arụ ya aka maka ọtụtụ ndị mmadụ tufuru ndụ ha n'Agha Rwanda.
E kwuru na o gburu oge inye iwu ka ndị agha udo nweta ngwaọgụ n'agha ahụ riri mmadụ ruru 800,000.
Ihe ọzọ ndị mmadụ tara ya ụta bụ nzọ ụkwụ ya n'ebubo e boro otu onye welitara isi n'ụlọọrụ UN a kpọrọ Ruud Lubbers.
E boro Ludder ebubo mmekpaahụ ụmụnwaanyị ya na ha na-arụ.