Nwoke 'kọnji' ji edinaala nwunye ya n'ụlọọgwụ.

Otu nwoke edinaala nwunye ya n'akwa orịa n'ebe a na-elekọta ụmụnwaanyị ya na-ejighị ahụ n'ụlọọgwụ.

Akụkọ kwuru na ụmụnwaanyị nọ n'ime ebe ahụ ihe mere rụrụ iri n'ọnụọgụgụ.

Ihe a mere n'ụlọọgwụ dị na mba Zimbabwe dika ndị ụlọọrụ mgbasa ozi a kpọrọ ''iHarare News'' si depụta.

Nwoke a, dika akụkọ si kwuo, mibanyere n'ime ya bụ ụlọọgwụ ga dina nwunye ya.

iHarare News depụtara na nwoke a, a ma ama dịka onye nwere ụlọ oriri n'obodo ahụ na ndị nọọsụ nwere ndọrọndọrọ maka ya ịhụ nwunye ya onye ahụ adịghị.

Dibia Bekee nwe ụlọọgwụ ahụ bụ Amadeus Shamu kwetere n'ihe a mere kwuru na ọ bụ mkpọtụ di na nwunye a mere mgbe ha na-emekọ ka ndị nọọsụ jị wee gbata ọsọ kpọọ ndị nchekwa bịara dọpụta nwoke ahụ ebe ahụ.

Nwunye nwoke ahụ kwuru na ọ bụru na o kweghị ka di ya dịna ya, o ga-eti ya ihe.

N'okwu nwunye ya, "ọ bụrụ na m emeghị, di m ga-eti m ihe n'ihu ụmụnwaanyị a maka na ọ na-etikarị m ihe oge ọbụla.''

Akụkọ ndị ga-amasị gị: