Ị hụla etu ndị Igbo si akwado BBC Igbo ka ọ bụ nwaanyị a lụrụ ọhụrụ?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

N'agbanyeghị na BBC Igbo arụọla ọrụ ọnwa isii na Naịjirịa, ọtụtụ ndị mmadụ ka na-akwado ha ka ọ bụ nwaanyị a lụrụ ọhụrụ maka mbọ ha na-agba ikwalite asụsụ Igbo.

Ndị mmadụ bidoro ịhụ uru BBC Igbo baara ndị Igbo, nke mere ka ha bido ikwuputa hoohaa na ha kwadoro ngalaba a.

Ọtụtụ na-ekpere ha ekpere ma na-agbakwa ha ume maka "ihe ọma a ha na-eme".

Ndị otu News Chronicle kwuru na ọ bụ ihe ọma na BBC bidoro nke asụsụ Igbo.

N'okwu ha: "...ihe a BBC meere anyị ga-enye aka kwụsị asụsụ anyị ịnwụfu."

Ha dere sị na Karl Uchegbu kwuru na "Ọ bụ ihe ọṅụ nye m oge m hụrụ Ọgbakọ BBC Igbo. Achọpụtakwara m na asụsụ Igbo m esighịzi ike. Achọrọ m ikele ndị hibere ihe a. Ụnụ Emeela! Ndeewo nu!"

Ndị ọzọ gara na Twitter ikwuputa etu ọ dị ha n'ahụ:

@mcpherdinand kwuru na obi na-atọ ya ụtọ na e nwere BBC Igbo.

@oganiruIgbo kwuru na BBC Igbo na-agba mbọ iru mpaghara Igbo niile.

Ndị ọzọ zipụtara ozi ekele:

@DelaQuaver kwuru sị na BBC Igbo na-enye ya ọṅụ.

Na Facebook, ọtụtụ ndị kwuru na obiọma na-eme ha maka ọbịbịa BBC Igbo.

Israel Etu kwuru sị: "Ekele kelere m ndị na-ahụ maka mgbasa ozi a a na-agbasa n'asụsụ Igbo na BBC. Ọ bụ ohere anyị nwere iji kwalite asụsụ na omenaala Igbo."

Nonnie Aneke sị "Obi dị m ụtọ isoro n'ihe BBC Igbo na-eme na mba niile."

John Hill kwuru sị "Ọ ga-adịrị ndị BBC asụsụ Igbo nwepụtara elu mma. Chukwu gọzie ụmụafọ Igbo."

Soni Orji kwuru sị "Obi jurum afọ oge m chọpụtara na BBC emepeela ngalaba asụsụ Igbo."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị