Ụmụnna na otu anọ ọzọ kacha mkpa n'ala Igbo

'Igbo enwe eze' bụ otu okwu ma nwa a mụrụ n'ala Igbo taa mara maka na ndị igbo na-ahụta onwe ha dịka ndị enweghi otu onye a kpọrọ eze.

Mana nke a apụtaghị na igbo enweghị usoro ọchịchị na-agara ha nke ọma na mgbe ochie.

Usoro ahụ nwere ike ọbụghị usoro ndị ọzọ nabatara mana ọ bụ etu ha ghọtara iji chịa onwe ha na-enweghi nsogbu ọbụla.

Mana oge ndị ọcha bịara, usoro a edoghi ha anya.

Usoro a bụ otu dị iche iche nwere ọrụ ha na-arụ n'obodo ịhụ na enweghi nsogbu dapụtara nakwa enweghi arụ ọbụla ga-emerụ ala.

Otu ndị a bụ; Ọkpala, Ụmụnna na ụmụada, otu ọgbọ, ndị nze na ọzọ na mmanwụ.

Ihe otu ndị igbo na-arụ

1. Ndị nze na ọzọ - Ndị nze na ọzọ bụ dị kachasị n'obodo, ha bụ ndị ikpeazụ okwu na-agakwu. Ha bụ ekwucha ọgwụ n'okwu niile gbasara obodo. Ha bụ ndị na-eji omenaala na ọfọ obodo ịhụ na a na-ekpe ikpe ziri ezi nakwa ịhụ na aka mmadụ niile kwụ ọtọ. Tupu anabata mmadụ n'otu a, ọ ga-abụ onye amamihe ha na-akpụ n'ala site n'ihe ọ hụrụla na ihe ọ gabigarala

Ya mere o ji abụ ụmụnwoke garala ọgụ na agha na mgbe mbụ, merie n'agha ma oge ụfọdụ jiri okpokoro isi mmadụ lọta.

A na-akwanyere ha ugwu pụrụiche n'ala Igbo ebe ndị nọ n'otu nze na ọzọ na-eyi ugo n'okpu ha igosi na ha bụ ndị e ji eme ọnụ n'obodo maka na ugo bụ nnụnnụ kachasị mma n'ala Igbo.

Akwa ọcha ha na-eyi na-egosi ndị dị ọcha n'obi nakwa n'agwa nakwa n;ikpe ziri ezi.

Okpu mmemme ha na-ekpu na-egosi na site n'ahụhụ ha nakwa ọbara ha mefuru n'agha ka ndị obodo ha ji aga n'ihu.

E kere ya udo abụọ; ndị nze na ndị ọzọ. Ndị nze karịrị ndị ọzọ n'ọkwa.

2. Ụmụnna - Ndị a bụ ụmụnwoke ụmụọkpala si n'ezinaụlọ dị icheiche n'obodo. Ha bụ ndị na-eme mkpebi gbasara okwu dị icheiche n'obodo etu o si gbasara agamnihu na ọdịmma obodo.

Ndị ụmụnna ka a na-ekpesara ma onye ọbụla mee ihe ọjọọ, ha bụ ndị na-aga n'ọnụ arụsị ịchọpụta ihe arụsị na-ekwu gbasara obodo maọbụ gbasara ezinaụlọ ha.

Ezinaụlọ niile na-enwe ndị ụmụnna ha bụ ebe a na-ebido ikpe ọbụla gbasara esemokwu dịka okwu ala, okwu ime obi, okwu gbasara ihe nketa nwaanyị na arụ megidere ala dịka onye gburu mmadụ, izu ohi, ịkwa iko maọbụ idina nwunye maọbụ di mmadụ. Mkpebi ọbụla ha mere na-adịgịde n'obodo niile.

A na-ahụ ụmụnna dịka ndị nnọchite anya si ezinaụlọ dị icheiche.

3. Ụmụada - Otu nke a bụ otu ụmụnwaanyị n'obodo, ebe a ka ụmụnwaanyị na-ejiko onwe ha ọnụ kpaa maka ọdịnaihu ezinaụlọ ha na ihe gbasara di ha na ụmụaka ha. Ndị ụmụada ka a na-akpọ ikpe udo oge ọbụla e nwere esemokwu n'etiti obodo na obodo ma ihe niile ha kpebiri, anaghị agbagha ya agbagha.

Ndị ụmụada bụkwa ndị na-ekpe udo n'etiti ụmụnne ha ụmụnwoke na ndị nwunye ha iji hụ na e nwere otu ihu maọbụ otu obi n'ezinaụlọ. Ndị ụmụada gụnyere ụmụnwaanyị ndị a mụrụ n'ezinaụlọ nakwa ụmụnwaanyị ndị alụbatara n'ezinaụlọ.

4. Otu ọgbọ - Nke a bụ otu ebe ndị bụ ọgbọ dịka ụmụnwoke a mụrụ n'otu oge. ha bụ ndị na-ahụ maka nchekwa obodo niile. Ha bụkwa ndị na-aga agha maọbụ ọgụ oge ọbụla ọgụ dapụtara. Ha bụ ndị na-ekpocha ụzọ, mmiri na ahịa ma o nwee ihe gbochiri ya maọbụ na mmiri buru ahịhịa nọchie ụzọ. Ọ bụkwa ha na-emepụta ihe ọbụla otu ụmụnna maọbụ ndị nze na ọzọ nyere n'iwu dịka ọ bụrụ na o nwere onye a ga-achụpụ n'obodo maọbụ onye a ga-amachị. Ha ga-agba mbọ hụ na onye ahụ pụrụ n'obodo ma gatee aka.

5. Mmanwụ - otu mmanwụ bụ otu na-anabata naanị ndị gabigara otu nnabata ha. Ha na-arụ ọrụ ndị uweojii hụ na e nwere usoro n'obodo. Oge ọbụla e nwere esemokwu dịka ala, mmanwụ na-aga kụọ ọmụ n'ala ahụ nke gosiri na o nweghi onye ọbụla a ga-ekwe ka ọ banye n'ala ahụ rue oge a mere mkpebi gbasara ya.

Mmanwụ nwekwara oge ọ na-apụta iji mee ndị obodo obi aṅụrị site na ịụ̀ba egwu.

Nyiri dị n'ọchịchị oge ahụ na nke ugbua

  • Ndị nze na ọzọ dịka ndị na-achị obodo, ha bụ ndị ikpeazụ okwu ga-erute ntị, ọ bụ okwu ọbụla na-ekweghi mmeta n'etiti ndị ụmụnna na ụmụada ka a na-ewetara ha. Ha bụ ekwucha ọgwụ n'okwu ọbụla
  • Ndị ụmụnna na ndị ụmụada dịka ndị nnọchite anya n'obodo. Ndị ụmụnna na-eme iwu gbasara obodo ebe ụmụ ọkpara n'ezinaụlọ dị icheiche n'obodo na-anọ na ya
  • Otu ọgbọ dịka ndị agha obodo, na-echekwa obodo ma na-ahụ na obodo niile bi n'udo. H na-aga agha maọbụ hazie ihe dị n'obodo na-adịghị eti o si kwesi.
  • Mmanwụ bụ uwejii obodo na-eje akpụpụta ndị mere ajọ ihe n'obodo.

Otu ndị a ka ala Igbo ji aga n'oge mbụ tupu ndị ọcha eweta usoro ha kpọrọ 'Warrant Chiefs' ebido.

Otu ndị a rụrụ ọrụ n'oge mbụ mee ka ala igbo na-aga n'ihu na-enweghi onye ọbụla ha kpọrọ eze mana etu ọ dị ugbua, a na-echizi eze e ji eme ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ajụjụ a na-azjụzị bụ, usoro ndị Igbo ji aga ugbua ọ na-eme ha nke ọma karịa usoro ha ji aga oge gara aga?