You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa mere taa: Ndi bu egbe agbagbuola otu onye ndu APC
Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a
Ụzụ akwa na-atụ n'ekiti steeti ugbua ebe ndi bu egbe gbatgburu otu onye ndu ndị ndọrọndọrọ ọchịchị APC n'ekiti steeti.
Bunmi Ojo bụ nwoke a gbagburu bụ bụ onye enyemaka Gọvanọ chiburu Ekiti steeti bụ Segun Oni.
Ọzọ,
Ndị uweojii na Benue steeti ekwuola na ndị abanyị di egwu egbuola ihe ruru mmadụ asatọ n'obodo Tse-ujoh dị n'okpuru ọchịchị Katsina-Ala na steeti ahụ.
Ha kwukwara na n'ime mmadụ abụọ ebugara ụlọọgwụ n'otu n'ime ha nwụrụ ebe nke ọzọ n'anata ọgwụgwọ.
Na mba ofesi,
Ndị uweojii na-atụ anya na otu nwoke anwụọla n'obodo Seattle mgbe ụbọelu o zuoro daturu n'ike mgbe a na-achụ ya ọsọ.
Nwoke ahụ amabeghị aha ya si n'ọdọugboelu Seattle-Tacoma zuru ụgbọelu ahụ mmadụ anọghị n'ime ya.
N'egwuregwu,
Aha ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ aha Delle Alli onye ọgba bọọlụ otu Tottenham Hotspurs.
Nke a bụ maka ọkpụ goolu ikpeazu o nyere nwetara ndị Tottenham mmeri nakwa nturugo o ritere na ngwụcha asọmpị dị n'etiti otu ya na Newcastle United.
Gee Nkeji nke mgbede a
Ihe onyonyo nke taa