You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Alli: Nwa afọ Naịjirịa ebuliela otu Tottenham na mmeri
Ndị mmadụ ji aha Dele Alli, onye ọgba bọọlụ otu egwuregwu Premier Lig agụ egwu n'igwe okwu soshal midia ugbua.
Nke a bụ maka etu goolu ikpeazụ Alli nyere nke kpatara na otu Tottenham meriri Newcastle United mgbe ha sọkọtara mpi taa n'ọgbọ egwuregwu St. James Park.
O turu ugo a kpọro "Man of the Match" na ngwụcha asọmpị ahụ ebe Tottenham jiri ọkpụ goolu abụọ asatara otu merie Necastle.
Lee etu ndị mmadu si nabata ya bụ mmeri na soshal midia.
Stighefootball sị na o mere ọfụma
Rick Spur kwuru na anaghị akwanyere ya udi ugwu o kwesiri dịka onye ọgba bọọlụ kachasị
Ụlọrụ @Paddypower kwuru na ọ bụ ya duru otu egwuregwu ya rue mmeri