You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Antonio Conte: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọchụchụ ya
Dịka otu Chelsea chụrụ onye nchịkọta otu egwuregwu ha bụ Antonio Conte, ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị gbara bọọlụ n'okpuru ya na-ekele ya maka ọrụ ọma ọ rụrụ, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ esemokwu ya na ụfọdụ nwere butere ọchụchụ ya.
A chụrụ Conte dị afọ 48, ụnyaahụ ka ọ chịkọtara Chelsea afọ abụọ.
Dịka onye nchịkọta Chelsea, Conte buliri otu iko Premier League na otu iko FA.
Ndị otu Chelsea depụtara maka ọpụpụ ya n'elu Twitter ha:
Na ngwụcha afọ gara aga, Chelsea kwụsịrị n'ọkwa ise na tebulu Premier League, nke pụtara na ha etozughị isonye na Champions League nke 2018/2019 site na Premier League.
Ihe ndị na-agbara Chelsea na-ekwu
John Terry gbaburu bọọlụ ma bulie otu iko Premier League n'okpuru Conte, kelere ya ma kwuo na ọ mụtara ọtụtụ ihe n'aka ya.
Gary Cahill bụ Kaptịn ndị Chelsea kelere Conte maka afọ abụọ o nyere Chelsea.
Ceaser Azpilicueta na-agba n'azụ Chelsea, sonyekwara na ndị kelere Conte maka ezi nchịkọta.
Ihe ndị na-akwado Chelsea na-ekwu
@manben6 na-akọwa na Conte na ọtụtụ ndị na-agbara Chelsea nwere okwu, nke butere ọchụchụ ya.
@futbolJurgen na-ekwu na ọ bụ Mourinho butere ọchụchụ ya.
@lorenzowisani na-akọwa na ọ bụ aha ọjọọ a na-akpọ ụbọchị ọbụla Fraịde dabara na 13 butere ọchụchụ Conte.
@Tom97HD kelere Conte ọfụma maka ihe o meere Chelsea.
@beejayslim2 kwuru na ndị si otu ọzọ na-akwa Chelsea emu maka ịchụpụ Conte.