You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Joe Blankson: Abalị itoolu elichara ya, ọ ka dị nwunye ya ka ọ bụ nrọ
Mercy, bụ nwunye Joe Blankson, nwoke nwụru ka ọ kpụpụtachara mmadụ iri na atọ dara na mmiri aka, si na ka abalị itoolu gara ka inichara ya, ya bu ihe ka dị ya ka nrọ.
Blankson nwetara ezigbo otito maka akpamike ọ kpara iji zọpụta ndị mmadụ mgbe ụgbọmmịrị kpuuru n'ime mmiri ha n' Pọtakọt.
Ọ bụ sọsọ Blankson nwụrụ na ya bụ mberede mere na ụbọchị Satọde, abalị 28 nke Jụlaị n'afọ 2018.
Mercy, bụ nwunye dike a hapụrụ gwara BBC na ihe di ya mere atụghị ya n'anya maka ọ bụ onye na-enyere ndị mmadụ aka ọfụma.
"Di m nwere obi ebere, nwe obi enyemaka, ọ na-etinye ndị ọzọ n'uche ya. Ya bụrụ ma mmadụ tiri mkpụ n'ọnụ ụtụtụ, ọ bụ sọsọ di m ga-ekuli ga za oku ahụ mara ihe na-eme ebe ahụ."
O kwuru na di ya na-egbo ọgụ ọ hụrụ ma ọ na-anya ụgbọala ya n'ụzọ.
Dike a dị afo 36, nụrụ Mercy n'afọ ise gara aga. Ha nwere ụmụaka atọ, mana nwa mbụ ha nwụrụ n'afọ 2016.
Mercy sị na ihe ọjọ a mere ya, nke bụ na ya agaghị ahụ di ya ọzọ, bụ ihe ya ka na-achọ ịnabata, maka na ọ na-eche na di ya nwere ike bata imeụlọ mgbe ọbụla. Ọ sị na ụlọ ha dị chakoo ugbua.
Mercy kwuru na otu oge nwa ya nwoke aha ya bụ Owen buru akpa ya sị na ya na aga Bakana ịga chọ nna ya.
Etu akụkọ a sị rute ya ntị
Na Satọde Jụlaị 28, Mercy sị na di ya gwara ya na ya ga-esi ọrụ ya ga akwamozi na Bakana.
Mana, ka di ya akpọghị ya ka chi na-eji etu o si eme, ọ kpọ ekwentị ya mana ọ bụrụ na ọ gbanyụrụ agbanyụ.
Mercy kpọrọ ndị ọyị di ya mana o nweghị onye gwara ya ihe ọbụla. Mgbe ahụ ka o bidoro chewe uche.
Ka e mechera, nne di ya bịara gwa ya na di ya nọ n'ime ụgbọmmiri kpuuru. Ọ gwakara ya na a nacho ya achọ.
Mercy sị n'uche ya bụ na a ga-ahụ ya na ndụ.
Ọ gara be nne di ya ma hụ ka ndi mmadụ juru na-ebe akwa. Ha gwara ya na ha ahụbeghị ha.
Ọ bụ ka chi foro ka nwunye di ya gwara ya na di ya anwụọla.
Ọ bụ ndị na-akụ azụ hụrụ ozu di ya na-elu mmiri.
E kweghị ya hụ ozu di ya maka omenaala ha sị na nwannyị na-enye nwa ara adịghị ahụ ozu di ya.
Ọzọ bụ na ọ bụ na mmiri ka a na-eli onye nwụrụ na mmiri.
Nke ga-eme ugbua
Mercy nwere olileanya n' ọnwụ di ya ga-eme ka gọọmentị tinye anya ma mezie ọdọ ụgbọmmiri dị n'Abonnema nke ga-enwe ihe eji echekwa ndụ.
O kwuru na ndị uweojii nke na-arụ na mmiri kwesiri ị na-enyocha ihe na-eme na mmiri, ma kwukwa na ngalaba na-ahụ maka mmiri kwesiri ịhụ na mmiri ahụ dị ọcha nke ga-eme ka ọ kwụsị ime ka ụgbọmmiri kpuo.
Ka ihe dị ugbua, Mercy Blankson si na gọvanọ Rivas steeti bụ Nyesom Wike, kwere nkwa inye aka maka ịzụ ụmụaka ya n'akwụkwọ ma nye ya ọrụ na gọọmentị.
Ọ sị na ọ ga-adị mma ma ya bụrụ na Bakana hiwere ihe ebe ahụ di ya nọ nwụọ, nke ga-enye ya ebe ọ ga atụ aka ma ya bụrụ na ụmụ ya jụrụ ebe elili nna ya.