Mmadụ iri abụọ na-aga Yurope anwụọla n'ime mmiri na Morocco

Ụlọọrụ nta akụkọ na mba Spain nke a na-akpọ El Pais kọrọ na ahụrụ ozu seele n'elụ mmiri ihe dika kilomita isii maọbụ asatọ n'ọnụ mmiri obodo Melila.

Akụkọ sị na ndị ọrụ nzọpụta mmadụ na akọwa na ha agụpụtala ozu ndị na mmiri.

Melilia na Morocco dịketere nso.

Ndị ọrụ nzọpụta nke mba Morocco wepụtara ozu ndị a ka ndị ọrụ otu ụgbọ mmiri na agafe hụrụ ka ha seere n'elụ mmiri we tipụ mkpu kpọọ ha.

E chere na ndị a nwụrụ ebe ha na-achọ ị gafenye Yurope n'elu ụgbọ mmiri n'agbanyehị na-enyere ịdọakanantị maka oke ifufe ga-efe.

Ndị ọrụ nzọpụta ka nọ n'elu mmiri achọ ozu ndị ọzọ maọbụ ndị ka nwereike ịdị ndụ. Echere na ndị mbịarambịara a si n'ọtụtụ mba nọ n'etiti Afịrịka

Ka akụkọ na-apụta amabeghị ezi ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ anwụ n'ihe mberede nke a.