You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Joseph Blankson nwụrụ ka ọ zọpụtachara mmadụ 13 mmiri na-eri
Mmiri riri Joseph Blankson ka ọ zọchara mmadụ 13 oge ụgbọmmiri bu mmadụ 24 na-aga njem na Bakana dị n'okpuru ọchịchị Degema nke Rivas steeti kpuru.
Akụkọ kwuru na ọdachi a mere oge Blankson, onye dị afọ 36, ma marakwa egwu mmiri ọfụma, tụnyere isi ya n'ihi ike ọgwụgwụ ka ọ mabara mmiri ịzọpụta onye nke iri na anọ.
N'akwụkwọ ozi nke gọọmentị Rivas steeeti wepụtara nke Kọmishọna mgbasaozi bụ Emma Okah binyere aka, gọọmentị tụrụ arịrị na ọ dịghị ndụ were rite erere dị n'aja Blankson onye hapụrụ nwunye ya na ụmụ abụọ chụrụ iji zọpụta ndị ọzọ.
Okah sị," Ike a pụrụ iche Blankson kpara bụ ihe nkuzi nye ndị dị ndụ na ọbụghị afọ ole mmadụ biri n'ụwa, kama ọ bụ ihe onye mere ka a ga-eji cheta ya."
Ka ọ dị ugbua, ọtụtụ ndị mmadụ na-eto dịmkpa a nwụrụ n'ọgbọ ọgụ maka inye ndụ ya ka ndị ọzọ were dị ndụ.
N'okwu ya n'igwe okwu Twitter, onye bụbu Osote onyeisiala Naijiria bụ Atiku Abubakar, na-ekwu na ọnwụ nwaamadị a na-echetara ndị Naijiria na ndụ ndị naijiria niile dị mkpa.
Ụfọdụ na-akpọ oku ka gọọmenti malite inyere ndị ezinaụlọ ọ hapụrụ aka, ebe ụfọdụ na-ekwu ka e nye ya nturuugo ala Naijiria.