You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụgbọ mmanụ efuola n'oke osimiri mba Bene
Enwebeghị ozi ọbụla e nwetara n'aka ụgbọ, 'Marine Express' nke e debara aha ya n' obodo Panama kemgbe ụbọchị Tọọsde.
Ihe ndapụta na-eme mgbe orubeghị otu ọnwa aka ndị ohi oke osimiri kpara ụgbọmmiri na mpaghara ahụ.
Otu mba uwa na-ahụ maka njem ụgbọmmiri a kpọrọ 'The International Maritime Bureau' na bekee kwuru na ndị agha mmiri mba Bene na-achọ ụgbọ 'Marine Express' nke bu mmanụ dị tọnụ puku iri na atọ, narị ise.
N'ọnwa Jenuwarị, aka ndị omekome kpara otu ụgbọmmiri ma jide ya abalị isii ganye mgbe a kwụrụ ha ụgwọ isi.
Mịnịsta India na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ Sushma Swaraj kwuru na gọọmenti Ịndia na nke Naijiria na Bene bụ ndị ọchịchị nọ na mpaghara ebe ihe a mere na-arụkọ iji chọta ụgbọmmiri ahụ.
Ọ bụ ụlọọrụ dị na mba Hong-Kong akpọrọ, 'Anglo-Eastern' na-elekọta ụgbọmmanụ ahụ na-efu efu.
Onye ntaakụkọ BBC bụ Will Ross kwuru na oke osimiri dịkachasị egwu bụ nke mba Somalia mana kemgbe e jiri zipụcha ụgbọ agha mba ụwa n'oke osimiri a, ka ihe bịara dịtụ mma.