You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Godswill Akpabio: Nsogbu ndị dapụtara maka ọpụpụ Akpabio na PDP
Ọ na-akpọtụ n'Akwa Ibom steeti ka onye bụbu gọvanọ ha bụ Godswill Akpabio, hapụrụ PDP gafee APC.
Akpabio na-anọchite anya ndị 'Ikot Ekpene Senatorial District' n'ụlọomeiwu ukwu, gafere APC ụbọchị Wenezde ka naanị ụbọchị anọ gachara ọ gbara ọrụ onye ndu ndị kachasị nta n'ụlọomeiwu ukwu nke Bekee kpọrọ 'Minority Leader' arụkwaghịm.
Kemgbe Akpabio kwupụtara ọpụpụ ya, elu na ala apụrụla ọkụ n'Akwa Ibom.
Gịnị na-eme?
- 1. A kpachiela akpaego ndị Akwa Ibom:
Akụkọ si na ntaakụkọ Cable.ng na-akọwa na e nyere iwu sị ka akpachie akpaego ndị Akwa Ibom, ka ego ghara ịpụ maọbụ bata.
Ndị EFCC ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ma ọ bụ eziokwu ma ọ bụ asị.
Ndị mmadụ na-ekwu na ọ dị ka Akpabio a ma na ụdịrị ihe a ga-eme, mere o ji gbaghapụ PDP gafee na pati nọ n'ọchịchị bụ APC.
Kola Ologbondiyan bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị PDP tinyere ọnụ na-asị ka a gbaghee akpaego ahụ ozugbo.
Onye ọzọ bụ @JacobsonBright1 na-ekwu na a gbachiri akpaego a maka na a chụrụ nwanne Akpabio n'ọrụ.
- 2. A chụọla ụfọdụ ndị n'ọrụ:
A chụọla ụfọdụ ndị ọkwa ha gbagoliteren'ọrụ, ọkachasị ndị a na-ahụta dịka ndị ha na Akpabio nwere otu mmekọrịta maọbụ ọzọ.
Otu n'ime ha bụ Ibanga Akpabio; nwanne Godswill bụbu kọmishọna nke mịnịstrị na-ahụ maka ọrụ (Ministry of Labour and Productivity).
Ndị ọzọ a chụkwara bụ Victor Antai bụbu Kọmishọna nke mịnịstrị na-ahụ maka Omenaala na Njem nlegharị anya (Ministry of Culture and Tourism).
Gịnị na-emezị ugbua?
Akụkọ ga-amasị gị