Saraki: Agbanyeghị ihe merenụ ike ọrụ agwụbeghị anyị

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Bukola Saraki bu ụzọ chetara ndị mmadụ etu ndị ọrụ nchekwa a kporọ DSS kpuchiri ihu ha si gbochie ndị omeiwu na ndị ọrụ ha ịbanye n'ụlọomeiwu.

O kwuru na ihe a bụ ihe ihere nke na-ekwesịghị ime; ''Ihe a butere obodo anyị bụ Naịjirịa aha ọjọọ ma mịtara anyị mkpụrụ ọjọọ.''

Saraki kwuru na ya bụ omume gosiri adịghị ike ndị chọrọ isi azụ ụlọ chutuo ndị isi ulọomeiwu.

Ọ dọkwara aka na ntị nye ndị na-achọ ihe n'ike n'ike sị na okwu a abụghị maka ya maọbụ osote ya bụ Ike Ekweremadu maọbụ Yakubu Dogara, kama ihe a metụtara ọchịchị onyekwuouche ya na Naịjịrịa.

Saraki kwuru na ọtụtụ olileanya dị n'ebe Naịjirịa nọ n'etiti obodo ndị ọzọ, ya mere ihe a ji jọgbuo onwe ya.

N'ọnụ ya, ''Naịjirịa agafeela ụdịrị iberibe a na-ebute ndọghachi azụ.''

"Chetanu na n'oge na-adịghị anya e kwuru m na Naịjirịa nwere ọchịchị n'ime ọchịchị a nọ ụgbua makana ọ gbawojuru anya ka onyeisi otu ngalaba ga-esi nye iwu ka a gaa wakpoo ụlọomeiwu.

"N'agbanyeghị ihe egwu dị na ya, anyị ga-aga n'ihu igbaso ikpe na-akwụghị ọtọ. Ndị Naịjirịa gosiri ụnyaahụ na ha agaghị ekwe mmegide oche maọlị.

"N'ihi na ọ bụ ndị Naịjirịa tinyere anyị n'ụlọomeiwu, mkparị ọbụla e nyere anyị bụkwa ndị Naịjirịa ka e nyere ya.

"Ihe mmụta m chọrọ ka gọọmentị etiti mụta ebe a bụ ka ha nye ndị ọrụ nchekwa ikike ịkwụrụ onwe ha."

Ihe niile o kwuru dị n'akara Twitter ya:

Mana lee ihe ndị Naịjirịa na-asa onyeisi ụlọọmeiwu ukwu na Twitter:

@Mansur_ahmed kwuru na mgbe izuụka a gachara, uche onye ọbụla ga-apụ n'ihe a mere n'ụlọomeiwu.

Ebe @ola_subomi01 kwuru na ihe a ga-eji cheta Saraki ma ọ nwụọ abụghị ihe nwere isi.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: