National Assembly: Gịnị na-eme n'ụlọọrụ ndị omeiwu n'ụtụtụ a?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọnụ na-ekwuchitere osote onyeisiala Naịjirịa bụ Laolu Akande ekwuola na ha ga-enyocha ihe mere eji gbochie ụfọdụ sineto ị banye ụlọomeiwu n'ụtụtụ a.

O kwuru na ọ maghị ma akụkọ kwuburu na e gbochiri ụfọdụ ndị sinetọ ị banye n'ụlọọrụ ha a bụ eziokwu.

Ọ gwara BBC Igbo na ọ gaghị ekwulị ihe ọ bụla gbasara nkpebị ndị ọrụ nchekwa mere mgbochi a.

Cheta na BBC nwetara ozi n'ụtụtụ a na ndị uweojii pụrụiche na-egbochi ndị Sịnetọ ịbanye ụlọọrụ ha ugbua n'Abuja.

Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ ụfọdụ sịnetọ ka DSS gbochiri ebe ha kwere ka ndị ọzọ banye.

A na-anụ kepu kepu na Ben Murray-Bruce bụ otu onye n'ime ndị e gbochiri ịbanye ụlọọrụ ha n'Abuja.

Akụkọ kwuru na-esi n'azụ ụlọ ezobanye ụfọdụ ndị sinetọ.

Olu Onemola bụ ọnụ na-ekwuchitere onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Bukola Saraki, tinyere ihe nkiri gosiri ka ndị DSS na-egbochi ndị mmadụ ibanye ụlọọrụ ha.

O kwukwara na ọ bụ atụmatụ ndị nọ n'ọchịchị ichutu Saraki na Ike Ekweremadu bụ osote ya, n'isi oche.

Omeiwu Rafiu Ibrahim so na ndị egbochiri.