Saraki: Oshiomhole sị na onyeisi ụlọomeiwu ukwu kpu okpu eze ha

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) bụ Adams Oshiomhole gwara ndị ntaakukọ n'Abuja na aka na-achị ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki kwesiri ị dee akwụkwọ arụkwaghị m dịka onyeisiụlọ omeiwu ukwu ngwa ngwa makana ọ pụrụ na APC gawa Peoples Democratic Party (PDP).

Oshiomhole kwuru nke a na ngwucha ọgbakọ ya na onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari na kwa ụfọdụ ndị gọvanọ na sinetọ APC mere ụnyaahụ n'Abuja.

O kwusiri ike na Saraki kwesiri ị kwanyere onwenya ugwu, na kwa dee akwụkwọ a, makana ọkwa dị ya n'isi dịka onyeisịụlọ ọmeiwu ukwu bụ makana ọ bụbụ onye otu APC, bụ ndi kachasị na ụlọomeiwu.

N'ọnụ okwu Oshiomhole: "Okpueze a bụ akụ nke otu APC. Ọ bụrụ na Saraki bụ onye nwere nsọpụrụ o kwesiri ị dee akwụkwọ a"

Nsogbu kadị n'APC

Aminu Tambuwal bụ gọvanọ Sokoto steeti kwuputara na ya apụọla na APC gawa PDP. O bụ ya bụ gọvanọ nke atọ pụrụ n'APC gawa PDP.

Cheta na gọvanọ Benue steeti bụ Samuel Ortom na Abdulfatah Ahmed, bụ gọvanọ Kwara, pụrụ n'APC gawa PDP.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu na Twitter

Okwu nke a Oshiomhole kwuputara butere mkparita ụka na Social Media.

Na twitter, otu nwoke aha ya bụ Nkoro Macilinus kwuru na oge eruola APC ga hapụ Saraki. Ọ gbakwara ajụjụ ọnụ na ọ bụ zị njọ na Sarakị pụrụ na APC gawa PDP?

Onye ọzọ aha ya bụ Adam Yusuph dere na ọ gbagwojuru ya anya na Oshiomhole na-ekwusi ike na okpueze onyeisi ụlọmeiwu ukwu bụ akụ nke APC. O kwukwara na udi okwu a bụ ihe na-emebi ọchịchị gọọmentị

Mana Maina Yahumi dere na onye ọbụla kwadoro onweya ugwu ga-eme ihe a Oshiomhole na-ekwu ugbua.

Akụkọ banyere ntuliaka 219 ka na-apụta, anyi ga-ewetara unu ha mgbe anyi wetere ha.

Akụkọ ga-amasị gị