Saraki: egwu ndị uweojii adagharịala

Egwu ndị uweojii adagharịala maka ihe ha gwaburu onyeisi ndị ụlọ omeiwu ukwu bụ Bukola Saraki ya were ọsọ were ije bịa zaa ha oku maka ịkọwa ka ya na ije siri gaa maka ohi ndị ojiegbeezu gara n'Offa n'ọnwa Eprelu.

Ugbua ndị uweojii sịzị Saaraki ya abịazịla, ma ya zite akwụkwọ ga-akọwa ka ya bụ ohi ezuru siri metute ya.

E nyedebere ya echi bụ Wenezde maka izite ya bụ akwụkwọ.

Cheta n'ụbọchị uka gara aga na ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Jimoh Moshood kwuru na ndị ohiegbe Offa ahụ kpọrọ Saraki na Gọvanọ Kwara steeti bụ Abdufatah Ahmed aha dịka ndị na-akwado ha.

Sarakị n'onwe ya sịkwara n'obi siri ya ike na-ịza ya bụ oku ndị uweojii kpọrọ ya tupu ya nwetazịa akwụkwọ nke sị ya ya mezie nkọwa n'akwụkwọ.

N'onu ya Saraki dere " dịka m dere n'akara twitter mbụ, enwetala m akwụkwọ ndị uweojii jiri sị m kọwa ihe m maara maka ya bụ ohi Offa na akwụkwọ nke m ga-ezitere ha na mkpụrụ ụbọchị abụọ, nke m ga-eme".

Nke a mechara ka onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris, onyeisi ndị DSS, lawal Daura nakwa onyeisi ndị ọkaikpe bụ Abubakar Malami (SAN) na osote onyeisiala bụ Yemi Osinbajo nwechara mkparịta ụka nzuzo na ụbọchị Mọnde n'obi onyeisiala n'Abuja.

Kepụkepụ ndị nta akụkọ nụrụ na-akọwa na ya bụ mkparịta ụka nwere ka ọsi gbasatụ ebụbọ a eboro Saraki.

Akwụkwọ akụkọ a na-ekwukwa na ọ dịka nwepu ewepuru ndị uweojii na-echekwa ndị isi omeiwu a kpatara osote onyeisiala jiri kpọ ha oku a.

Na agbagheghị, onye ndụmọdụ Sarakị na ihe gbasara ọchịchị onyekwuo uche ya bụ Kingsley Amaku kwara BBC ụnyahụ na-eziokwu atọgbughị na ya bụ okwu.

Ka nke a na-eme ndị nPDP akatọla ya bụ ebubo a ana ebo Saraki na Ahmed.

Onyendụ ha bụ Alhaji Kawu Baraje kwuru na ha agaghịzị enwe ya bụ mkparịta ụka nke ha na otu APC na onyeisiala, Buhari chọrọ ịnwe.

Cheta na ndị nPDP na osote onyeisiala bụ Osibanjo hụru n'izu gara aga ma kwekọrịtakwa ihụ ọzọ ụnyahụ bụ Mọnde.

Mana ihe ndị a mere gosiri na ndị APC adịghị nkwadobe ịme ka ya bụ ọgbakọ wee isi, dịka Baraje siri kwuo.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: