You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Visa: Gọọmentị etiti akwụsila ịnye ndị inginịa mba ofesi akwụkwọ
N'iji wee hụ na ndị ntorobia enginia sitere na Naịjirịa nwetachara ọrụ nke ọma, gọọmentị etiti akwụsịla ị nye ndị inginia mba ofesi akwụkwọ njem ị bata Naịjirịa rụọ ọrụ.
Ha kwukwara na ha e wepụtala iwu ga-ahazi ngalaba na-ahụ maka ihe nrụpụta na Naịjirịa.
Minista na-ahụ maka mmiri bụ Suleiman Adamu bụ onye nọchitere anya onyeisiala Muhammadu Buhari n'emume ndị inginia kwuru na ministri na-ahụ maka nhazi Obodo bidoro mmanye mkpebi a nke so na iwu onyeisiala wepụtara.
@Ade_Gokay sị na mkpebi a amaka makana ọ bụchaghị ndị inginia niile si mba ofesi bụ ezigbo ya.
Buhari na-ayọkwa Mahadum ndị nọ Naịjirịa ka ha wulite etu ha si akụzị inginiaring ka ndị inginia a zụrụ ebe a ka ndị a zụrụ na mba ofesi mma.
Mana mgbe BBC gbara otu onye inginia bụ Azubuike Agbasi ajụjụ ọnụ gbasara ya bụ mkpebi.o kwuru na ọ ga-emebi ihe nke ukwu na Naịjirịa.
Agbasi kwuru na kama a ga-akwụsị ị nye ha akwụkwọ njem nchanacha, ka e bie nke nke ndị a na-enye.
O kwukwara na ọ ga-adịmma ma enye sọsọ ndị inginia ukwu akwụkwọ njem makana ha ga-enyere aka n'ọzuzụ ndị inginia na-eto eto na Naịjirịa.
Mana onye engineer so n'otu akpọrọ "Council for the Regulation of Engineering in Nigeria".
(COREN) na-achọghị ka akpọpụta aha kwuru na ya bụ mkpebi dịmma makana ọ ga-eme ka ndị inginia Naịjirịa nweta ọrụ ndị ọcha na-abata obodo a bia anara ha.
O kwukwara na o ga-eme ka ha tinye uchu n'ihe ha na-eme.