Lee webụsaịtị ndị ụlọọrụ odeakwụkwọ Naịjịrịa e ji nde naịra 64 wee hazie

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ụlọọrụ odeakwụkwọ Naịjirịa kwuru na ha ji nde naịra 64 n'ọma wee hazie webụsaịtị ha bụ www.osgf.gov.ng.

Odeakwụkwọ ahụ bụ Boss Mustapha kwuru na ihe ụlọọrụ ahụ na-arụ na Naịjirịa kwesiri ha inwe webụsaịtị pụrụiche ga-egosi ọrụ ha.

Mustapha kọwara na etu webụsaịtị ahụ dibu na mbụ egosighi ọkwa ụlọọrụ ahụ.

Mana ihe a abọliela uzu n'ebe ụmụ Naịjirịa nọ dịka ha na-ajụ ụdị webụsaịtị a ga-eji ụdị ego ahụ rụọ.

Ụmụ Naịjirịa nọ na twitter kwuru uche ha na etu o si emetụta ha.

Damilola na-ajụ ụdị webụsaịtị a ga-eji ụdịrị egọ ahụ wee rụọ, na-ekwu ka a kọwara Naịjirịa etu e si mefuo ego ahụ.

N'akụkụ nke ya, Segun Joseph kwuru na ọ dịka ụdị webụsaịtị a anaghị eji ego data tupu e mepee ya.

Ọ dịka o juru Olawale Adetula anya maka na ọ na-ajụ ka ọ bụ webụsaịtị a ka e ji nde naịra 64 we hazie.

Akụkọ ga-amasị gị: