You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nwaanyị tọrọ onwe ya, ebe ụra buru onye ntọọ ọzọ ṅụrụ Tramadol
Ndị uweojii nwụchiri Nwaanyị tọro onwe ya iji nata di ya nde naịra 15 na Ogun state, ebe aka kpara onye ntọo ebe ọ gara ịtọrọ mmadụ ma ụra buru ya ka ọ ṅụchara ọgwụ ike Tramadol.
Mana ndị ọkachamara n'ihe gbasara omume ndị mmadụ bụ psychologist ' na bekee na-ekwu na ụdị agwa bụ oke mpụ na ajọ enyị bụ ihe kpatara ya.
Femi Joseph na ndị otu ya ji egbe wakpo ọdọahịa ọgwụ ịtọrọ onye nwe ya mana ụra buru Joseph ka ọ nụchara tramadol e nwetara n'ụlọ ahịa ọgwu ahụ.
Dị ọkpa ahụ kọwara na oge ha batara onye nwe ụlọ ahịa ọgwụ ahụ tiri mkpu ma si ụzọ azụ ụlọ gbaa ọsọ.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Ondo steeti sị, "Mana dịka ha enwetaghị ihe ha chọrọ, otu n'ime ha bidoro sọwa ganị ganị n'ihi tramadol ọ ṅụrụ.
"O rahụrụ ụra awa 24 ka ọ ṅwụchara ya. E nwetakwara mkpọ tramadọl n'akpa ya."
N'aka nke ọzọ, otu nwaanyị aha ya bụ Hadijat Kabir na mmadụ abụọ ndị ọzọ gụnyere otu nwoke na nwaanyị ọzọ kpara nkata aghụghọ na ndị ntọrị ji ya ma naa di ya nde naira 15.
Kọmishọna ndị uweojii na legos steeti bụ Imohimi Edgal, kwuru na ọ bụ mkpesa di ya wetara mere ka ha bido nyocha were chọpụta na ọ bụ nwunye ya na ndị omekemo kpara nkata ahụ.
Okammuta n'ihe gbasara omume mmadụ nakwa onye nkuzi n'Ebonyi State University bụ Nnachi Amos kwuru, na ọ bụghị isi mmebi kpatara ụdị akwa kama"Ihe ọjọọ bara ụba ugbua. Ụfọdụ bụ mkparita ọjọọ site na inwee ajọ ọyị."
Ogbo ya nọ na Federal Neuro-Pychiatric Hospital dị na Yaba, Legos bụ Chinyere Okonkwo kwenyere n'ihe Amos kwuru.
"Isi zuru ha oke. I lee anya, ọrụ ntọrị abụghị ọrụ dị mfe. Mpụ na ajọọ ihe karịrị."