Etu ndị uweojii si 'gbapụta' nna Mikel Obi n'aka ndị ntọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii Naịjịrịa kwuru na ndị ntọ atọhapula nna onye nchịkọta ndị otu egwuregwu 'Super Eagles' bụ John Mikel Obi.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu, kwuru na ọ bụ eziokwu na ndi ntọ tọrọla nna Mikel ụbọchị tusde garaaga.

Ndị ntọ a manyere nna Mikel sị ya gbara ụkwụ nkiti gaa ije dị anya (ihe ruru kilomita ise) n'ime oke mmiri na-ezonu.

Amarizu kwukwara sị na a gbapụtara nna Mikel ka ndị uweojii na ndị ntọ ahụ lụchara ọgụ egbe, tupu ndị ntọ ahụ agbafuo.

Ndị uweojii Enugwu steeti dere maka ya na Twitter ha:

Mikel kwuru sị na ọ nụrụ na ndị ntọ ji nna ya n'ime elekere anọ tupu asọmpi egwuregwu dị n'etiti Naịjirịa na Ajentina ebido n'Iko Mbaụwa a gbara na Rọshịa.

Akụkọ kwuru sị na a tọrọla nna ya n'ụzọ Makurdi-Enugu, ka o si Jọs na-aga akwamozu n'ọwụwa-anyanwụ.

Mikel kwuru sị ka ndị uweojii gbapụtara ya ụbọchị Mọnde, na nna ya nọ n'ụlọọgwụ ugbua na-anata ọgwụgwọ maka na ndị omekome ahụ tara ya ezigbo ahụhụ.

O kwuru sị na ọ gwaghị ndị otu ya maọbụ ndị nchịkọta otu egwuregwu Naịjirịa.

Ọ sị "A gbara m bọọlụ ka nna m nọ n'aka ndị ntọ...akwaturu m ihe mgbawa obi ahụ."

Mikel kelere ndị uweojii n'akara Twitter ya:

Otu akụkọ kwuru sị na a kwụrụ dọla puku 28 ($28,000) bụ ego mgbapụta nke bekee kpọrọ 'ransom'.

Cheta na nke a mere ya ugboro abụọ a na-atọ nna Mikel, makana a tọrọ ya mbụ na Jọs n'afọ 2011.