You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu ndị uweojii si 'gbapụta' nna Mikel Obi n'aka ndị ntọ
Ndị uweojii Naịjịrịa kwuru na ndị ntọ atọhapula nna onye nchịkọta ndị otu egwuregwu 'Super Eagles' bụ John Mikel Obi.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ebere Amaraizu, kwuru na ọ bụ eziokwu na ndi ntọ tọrọla nna Mikel ụbọchị tusde garaaga.
Ndị ntọ a manyere nna Mikel sị ya gbara ụkwụ nkiti gaa ije dị anya (ihe ruru kilomita ise) n'ime oke mmiri na-ezonu.
Amarizu kwukwara sị na a gbapụtara nna Mikel ka ndị uweojii na ndị ntọ ahụ lụchara ọgụ egbe, tupu ndị ntọ ahụ agbafuo.
Ndị uweojii Enugwu steeti dere maka ya na Twitter ha:
Mikel kwuru sị na ọ nụrụ na ndị ntọ ji nna ya n'ime elekere anọ tupu asọmpi egwuregwu dị n'etiti Naịjirịa na Ajentina ebido n'Iko Mbaụwa a gbara na Rọshịa.
Akụkọ kwuru sị na a tọrọla nna ya n'ụzọ Makurdi-Enugu, ka o si Jọs na-aga akwamozu n'ọwụwa-anyanwụ.
Mikel kwuru sị ka ndị uweojii gbapụtara ya ụbọchị Mọnde, na nna ya nọ n'ụlọọgwụ ugbua na-anata ọgwụgwọ maka na ndị omekome ahụ tara ya ezigbo ahụhụ.
O kwuru sị na ọ gwaghị ndị otu ya maọbụ ndị nchịkọta otu egwuregwu Naịjirịa.
Ọ sị "A gbara m bọọlụ ka nna m nọ n'aka ndị ntọ...akwaturu m ihe mgbawa obi ahụ."
Mikel kelere ndị uweojii n'akara Twitter ya:
Otu akụkọ kwuru sị na a kwụrụ dọla puku 28 ($28,000) bụ ego mgbapụta nke bekee kpọrọ 'ransom'.
Cheta na nke a mere ya ugboro abụọ a na-atọ nna Mikel, makana a tọrọ ya mbụ na Jọs n'afọ 2011.