You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ozubulu Church Massacre: Gịnị ga-emezi ugbua otu afọ gafere?
Iji cheta ụbọchị e gburu ọchụ n'ụlọụka Katọlik St Phillip's dị n'obodo ha, ndị Ozubulu mere ekpere ncheta ma kpee ka ụdịrị ihe a ghara ime ọzọ.
Peter Uzokwe bụ onyeisi-gburugburu otu 'Ozubulu Development Union', kwuru nke a mgbe ndị NAN gbara ya ajụjụ ọnụ.
Otu afọ agafeela kamgbe ndị bu egbe batara n'ụlọụka a gbagbuo ndị bịara ikpe ekpere n'isi ụtụtụ.
Ihe ọjọọ a mere n'okpuru ọchịchị Ekwusigo dị n'Anambra steeti, mere ka ndị Naịjirịa jụọ na ọ pụtara na anaghị asọzị ụlọụka nsọ?
Ihe ị kwesịrị ịma
- 1) Mmadụ ole nwụrụ?
Mmadụ iri na atọ (13) nwụrụ ka ndị omekome a gbara ha egbe ebe ha gbakọrọ ịka ụka nke Bekee kpọrọ 'mass', ụbọchị Sụnde, Ọgọst 6, 2017.
Otu onye n'ime mmadụ 13 a bụ Cyprian Ikegwuonwu; nna Aloysius Ikegwuonwu bụ onye akụkọ kọrọ sị na ndị a chọ bịa n'ụlọụka ahụ bụkwa nke ọ rụrụ.
- 2) O nwere ndị a nwụchiri?
Kọmishọna ndị Uweojii Anambra steeti bụ Garba Umar, kpọpụtara aha mmadụ abụọ a na-enyocha maka mwakpo a bụ Charles Obi a ma dịka Gozila na Dickson Nwodi.
Kama o kwuru na ha abụọ nọ n'ụlọmkpọrọ na mba Saụt Afrịka.
Ha kwukwara na a na-enyocha mmadụ anọ ndị ọzọ bụ Great Chinedu Akpunonu (44), Vincent Ike (57), Chukwudi Ugwu (30) na Onyebuchi Mbanefo (46).
- 3) Gịnị mere ndị a na-enyocha?
A kpụpụrụ mmadụ anọ a (Akpunonu, Ike, Ugwu na Mbanefo) ụlọikpe Magistrate dị n'Ozubulu, ebe a na-ekpe ha ikpe maka igbu ọchụ nakwa ịkpa nkata.
Lee ozi eziputara gbasara emume a n'akwụwọ ntaakụkọ @b_4_bea tinyere na Twitter.