Ụmụnwaanyị Ozubulu emeela ngosiputa

Ụmụ nwaanyị Ozubulu nọ n'okpuru Ekwusigo na Anambra steeti gara n'ụlọọrụ ndị uweojii nke dị n'Amwabia ị rịọ ha mkpuchi ụnya ahụ.

Ha mere nke a maka ịkpe dị n'etiti ndị echere na ha-wakporo ụlọụka dị n'obodo ha n'ụbọchị 6 ọgọstụ afọ gara aga.

Ha sị na ndị a na-eyi ndụ ha egwu na ọ bụkwa n'ihi nke a ka ha na-achọ mkpuchi ndị ga-enye akaebe megide ndị wakporo ha n'ụlọ ikpe.

Ha bu akwụkwọ nnukwu gaa-ebe ahụ edere "anyị chọrọ ịkpe zuruoke" "anyị chọrọ mkpuchi ndị uweoji n'ụlọikpe"

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweoji na Anambra bụ Nkiruka Nwode gwara BBC Igbo na-ekwe ntị na ihe dị ụmụnwaanyị a mkpa bụ ka udo were ọnọdụ n'obodo ha.

Nwode sị na ụmụnwaanyị a na-eme ihe a rịọrọ ndị uweoji mkpuchi ka ha na-akwado ịga ụlọikpe maka ụchụ e gburu n'obodo ha.

Onyeisi ndị uweoji na Anambra steeti bụ Garba Baba Umaru nyere ụmụnwaanyị a nkwado, sị ha gaa n'iru.

Umaru gwara ụmụnwaanyị ahụ na "ebe ọ bụ na m nọ ebe a, ọnweghị ihe ga-eme unu, m ga-ahụ na unu nwetara ikpe zuruoke".

Ihe mere n'Ozubulu

  • Ndị bu egbe gara n'ụlọụka St. Phillips nke ụsoro Katolik were gbagbuo ndị mmadụ ebe ha na-aka ụka
  • Mwakpo a mere chịrị ndụ mmadụ 11 n'ụtụtụ Ọgọstụ 6 afọ 2017
  • Akụkọ sị na ọ bụ esemokwu n'etiti mmadụ abụọ bi na Mba Saut Afịrịka butere ihe a.
  • Nke a mere ka ndị uweooji nke Mba Naịjirịa na Saut Afrịka bido nyocha n'ime okwu a
  • Ndị eboro ebubo na ọ bụ ha kpara nkata ghọrọ ngịga n'okwu mkpamkpa ahụ mere bụ: Onyebuchi Mbanefo, 46, Chukwudi Ugwu, 30 na Great Chinedu Akpunonu, 44
  • Okwu a ka nọ n'ụlọikpe ebe ndị akaebe jisike na-apụta kwa ụbọchị

Akụkọ ndị ga-amasị gị: