Lai Mohammed ekwuola na ịgafe pati ọhụrụ agaghị egbochi nyocha onye ọbụla

Lai Mohammed ekwuola na ịgbaga na pati ọzọ agaghị egbochi nyocha na ikpe ziri ezi.
O kwuru nke a mgbe ndị ntaakụkọ na-agba ya ajụjụ ọnụ mgbe ọ gara nleta ụlọọrụ ndị ntaakụkọ.
Mohammed kwuru na ọ bụrụ godi na mmadụ si na pati ọzọ gbabata na nke ha bụ APC na nyocha onye ahụ ga-aga n'ihu.
Ọ sị "nkwa anyị na-ekwe ndị Naịjiịrịa bụ na ị gafe patị ọzọ agahị apụta na aga-emechi okwu onye ọbụla ma ọ bụrụ na ọ merụrụ aka"
O kwukwara n'ihe gbasara asambodo Kemi Adeosun dị n'aka ngalaba o kwesiri nakwa na nyocha ya ka na-aga ihu.
Cheta na ụlọọrụ ntaakụkọ Premium Times boro Kemi Adeosun ebubo ịbu asambodo adigboroja mana rue ugbua ma ya ma onyeisiala ekwuputabeghi okwu maka ya.







