You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ dị mkpa n'ụtụtụ a: 'Super Falconets' agaala iko mbaụwa ụmụnwaanyị taa
Akụkọ dị mkpa
Onyeisioche otu APC bụ Adams Oshiomhole agwaala onyeisi ụlọomeiwu sineti bụ Bukola Saraki ya si n'ọkwa ya ritue.
Oshiomhole gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ugwu kwesiri ekwesi dịka ya, onyeisiala Muhammadu Buhari na ụfọdụ ndị sinetọ APC gbachara izu ụnyaahụ na.
Ihe ọzọ pụtara na nzụkọ ahụ bụ na aka na-achị Imo steeti bụ Owelle Rochas Okorocha kwuru na ọ nweghi onye ọzọ ga-ahapụ pati ha.
O kwuru na ha bubu n'uche na ndị ahụ gafere n'otu PDP na ndị ọzọ ga-apụ.
Na mba ofesi,
Otu chikọtara mba uwa niile bụ UN nakwa mba Briten arịọla ka ndị agha jiri nwaanyọ sobe ndị na-eme ngagharị iwe ntuliaka na mba Zimbabwe.
Cheta na ọgbaaghara dara na ntuliaka emere na Zimbabwe ụnya ahụ tara isi mmadụ atọ.
N'egwuregwu,
Otu egwuregwu bọọlụ nke ụmụnwaanyị Naịjirịa bu Falconets ga-aga mba France taa
nke a bụ maka njem ị bụlata iko mba ụwa ụmụnwaanyị na-ebido na France n'ụbọchị ise nke ọnwa ọgọst.
Lee nkeji nke ụtụtụ a