You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Zimbabwe: UN etinyerela ọnụ n'ọgbaghara malitela na Harare maka ntuliaka
Ngalaba jịkọ mbaụwa bụ United Nations (UN), mba Briten na mba Amerịka etinyere ọnụ n'ọgbaghara na-eme na mba Zimbabwe.
Onyeisi Yun bụ Antonio Guterres rịọ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na Zimbabwe ka ha kpachara anya, ka onye na-ahụ maka ihe metụtara mba ofesi na Briten bụ Harriet Baldwin si na ọgbaghara a na-emetụta ya n'obi nke ukwuu.
Ọgbaghara dara n'etiti ndị nchekwa obodo na ndị na kwado Nelson Chamisa bụ onye na-azọ oche onyeisiala mba Zimbabwe ka emechara ntuliaka n'ụbọchị Monde.
Mmadụ atọ nwụrụ n'ọgbaghara bidoro mgbe ndị na-akwado otu pati na-anọghị n'ọchịchị bụ Movement for Democratic Change (MDC) kwuru na pati na-achị ugbua bụ ZANU-PF ghọrọ aghụghọ na ntuliaka ahụ.
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka na Zimbabwe kwuru na ZANU-PF meriri ntuliaka nke eji hụpụta ndị omeiwu, nke mere ndị na-akwado MDC jiri bido ngagharị iwe na Harare, isi obodo Zimbabwe.
Gọọmentị Zimbabwe mechara zipu ndịagha na ndị uweojii ịhụ na ọghaghara ahụ kwụsịrị.
Onye na-ekwuchite ọnụ Chamisa katọrọ ogbugbu mmadụ ato ahụ ma kwuo na "onweghị ihe a ga-eji kọwa mmekpa ahụ" nke ya hụrụ.
"A na-akụzịrị ndịagha igbu mmadụ ma a na-anụ agha. Ndị nkịtị ha abụzị ndị iro?"
Akpọbeghị aha onye meriri ntuliaka nke onyeisiala, mana ndị MDC na-esi ọnwụ na Chamisa meriri onyeisiala Emmerson Mnangagwa.
Nke a bụ ntuliaka mbụ ndị Zimabawe na-eme kemgbe achụtụrụ Robert Mugabe n'ọchịchị.