Zimbabwe: Ndị zuru ego enweghachila ya

Onyeisi ala Zimbabawe bụ Emmerson Mnangagwa kwuru na eweghachila ogogo ego niile ezuru ezu nke edepụtara n'akwụkwọ.

Na ọnwa November gara aga, ụlọ na-ahu maka nchekwa na Zimbabwe nyere ha ọnwa ato iji weghachi ego ndị ahụ ezuru.

Iwu ọnwa atọ ahụ ji ụnyaahụ wee gafee.

Ndị ụlọọrụ mgbasa ozi a kpọrọ Bulawayo 24 depụtara ihe Mnangagwa kwuru dịka onye obi ụtọ na-akpa maka ihe a merenụ:

"Ụfọdụ ndị hụrụ obodo ha n'anya e weghachila ego ha zuru. Aha ndị zuru ego edepụtara karịrị, mana a ga-akpọpụta mkpebi erutere".

Akụkọndị ọzọ ga-amasị gị:

N'ime akwụkwọ ahụ onyeisi ala Zimbabwe kwuru na ya chugide ndị niile na-eweghachibeghị ego ha zuru rue mgbe ha wetere ya.

"Anyi ji aha ụnụ ma jidekwa ihe niile ụlọakụ nyere anyi gbasara ụnụ."

A na-atụ anya na ụdị ihe a ga-eme na Naijiria ebe akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị nọ ọchịchị zuru ọtụtụ ego.