Mba Saudi Arabia eritela dọlla nde narị na agha mpụ ego

Mba Saudi Arabia na-ekwu na ha enwetala ihe karịrị dọlla otu nde narị site na ibụ agha ha na bụkwasa mpụ na nruru aka ego.

Agha a butekwara itunye mmadụ iri ise na isii n'ime mmadụ nari atọ ejidere n'ime ụlọ nkpọrọ. mmadụ iri ise ndị a si na ezi na ụlọ ndịeze.

Onye okaiwu kachasị n'ala Saudi Arabia a na-akpọ Sheikh Saud al-Mojeb sị na nyochapụta nke a were ha ọnwa atọ.

Ka akụkọ a na-apụta a ka a na-agba mbọ ka amara maọbụ nke ezie.