You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Zimbabwe election: Emmerson Mnangagwa ejirila obere ihe gafee
Onyeisisala Zimbabwe bụ Emmerson Mnangagwa meriri ntuliaka eji họpụta, ngalaba na-ahu maka ntuliaka na Zimbabwe kwuru.
A gụọla vootu mpaghara iri, nke gosiri na Mnangagwa nwetere pacenti 50 n'ime vootu atụrụ ka Nelson Chamisa nke pati na-anọghị n'ọchịchị bụ MDC nwetere percent 44..
Mana, ndị MDC ekweghị n'ihe ngalaba ntuliaka Zimbawe kwuru, nke mere ndị uweojii ji kpọpụ ha n'ebe a na-agụ vootụ ahụ.
Onyeisis MDC sị na vootu ahụ agụpụtara ezighi ezi.
Mnangagwa kele ndị nkwado ya na Twitter ma kwuo na mmeri ya bụ "mmalite ọhụrụ".
Chamisa na-esi ọnwụ na ọ bụ ya meriri ntuliaka a, nke mere oji gwa ndị ntaakụkọ ụbọchị Tusde na ZANU-PF chọrọ "ịghọ aghụghọ", bụ ihe ha "agaghi ekwe ka ome".
Mana ngalaba Zimbabwe Electorial Commission (Zec) sị onweghi nrụrụ aka ọbula emere.
Mmadụ isi nwụrụ mgbe ndị na-akwado MDC mere ngaghari iwe n'ụbọchị Wenesde.
Ntuliaka bụ nke mbụ Zimbabwe na-eme kemgbe Robert Mugabe pụrụ n'ọchịchị n'ọnwa Novemba nke afọ 2019.