You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Eunice Atuejide ọ gbaala onwe ya egbe n'ụkwụ?
Otu nwaanyị na-apụta ịzọ ọkwa ọchịchị onyeisiala bụ Eunice Atuejide na-enweta ọkụ ugbua dịka aha ya na-ewu maka okwu 'feminism'.
Eunice kwupụtara n'akara Twitter ya na ya abụghị 'feministi' ma ncha.
N'okwu ya, "Abụghị m feministi! Nwaanyị anaghị esiri di ya nri? Ụmụnwaanyị na-akparị ụmụnwoke maka na ọ masịrị ha?"
Ọtụtụ mmadụ anabataghị okwu a okwuru, ha bidoro ịkatọ ya.
@OlayinkaFO1 kwuru na ọ bụ ihe mwute na nwaanyị dịka ya aghọtaghị ihe feminism pụtara.
@NaijaFlyingDr kwukwara na ozi ya gosiri na ọ ghọtaghị ihe bụ feminism.
@Allyshimmer kwuru na ịbụ feminism bụ nwaanyị ịnwe ohere ị họrọ ihe ọ chọrọ ị bụ na ndụ ya.
Mana ọ bụghị onye ọbụla katọrọ ya, @KingDavidJasper kwuru na ndị mmadụ aghọtaghị ihe ọ na-ekwu.
...Mana ọ dịghị ka ihe ndị a emetụrụ Eunice, lee ihe o kwuru maka ihe a na-eme.