You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Akụkọ kachasị mkpa: 'Ndị ZanuPF rapụtara m' - Mugabe
Akụkọ dị mkpa:
Onye bụbu onyeisiala mba Zimbabwe ekwuola na ọ gaghị akwado onye nọchịrị anya ya n'ọkwa ọchịchị bi Emmerson Mnangagwa n'ihi na ọ kwapụrụ ya n'ọkwa ọchịchi.
O kwuru na ọ ga-atụnyere ndị ọzọ na ntuliaka a na-akwado ịme na mba Zimbabwe.
Ndị uweojii n'Enugu steeti achọrọla nwoke na-ebiputa ego adigboroja gaa n'ụlọ ya dị na Legos ma nwuchie ya.
Nwoke a aha bụ Collins Oputa bụ onye Ohaji n'Imo steeti arịọla mgbaghara ma kwuo na ọ bụ ọrụ aka ekwensu butere nke a.
Ndị agha Naịjirịa egbuola mmadụ iri na isii so n'otu Boko Haram ma jichie ngwa agha ndị ọzọ na Borno steeti
Onyema Nwachukwu bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị agha kwuru na nke a mere mgbe ndị Boko Haram na-akwado i wakpo obodo Mairari dị na steeti ahụ.
N'egwuregwu,
Ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na Naịjirịa bụ NFF ekwuola na ha ga-enye Carl Ikeme ọkwa dịka onye nkuzi oche bọọlụ n'otu Super Eagles.
Cheta na Ikeme wụsara bootu ya n'ihe gbasara egwuregwu bọọlụ abalị ole na ole gara aga.
Gee Nkeji nke mgbede a
Ihe onyonyo nke taa