Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ọchịchị akaike abatala Naịjirịa - Ohaneze

Ọdịka ọchịchị akaike abatala Naịjirịa

Onyeisi Ohaneze Ndigbo bụ Nnia Nwodo akwala arịrị na ihe na-eme na Naịjirịa ụgbụa na egosi na ọchịchị aka ike abatawala obodo a.

Nwodo kwuru nke a ụnyahụ ebe ajụrụ na ụgbọelụ ndị ọnụ na-erụ na okwụ na ndịda Naịjirịa jị bata Markudi bu isi obodo Benue steeti agaghị ada.

Abụbụ ọrụ na-esi

Otu jikọtara ndị isi ọrụbekee bụ Association of Senior Civil Servants Agbarụọla ihu maka nkagbụ akagburu ụle mbụli elụ na ọrụ nke ndị otu ha gara n'Abụja.

Ode akwụkwụ ndị otu a bụ bashhir Lawal dọọrọ aka na ntị na ọbụrụ na akwụchịghị ndị otu na gara ya bụ ụle akagburu ụkwọ ha jiri ga ya bụ njem, na abụbụ ọrụ dị egwu ga esochị ya na-azụ.

Trump na Putin ezukoola

Nkato esochiela njem nleta Onyeisiala Donald Trump na Valdmir Putin nke Russia mere na Finland.

Onye ọnụ na erụ na ọkwụ na Pati Republican bụ Paul Ryan gwara Trump ya cheta na Russia abughị enyi mba Amerika.

N'egwuruegwu

Dịka egwuruegwu iko mbaụwa bịara n'isi njedebe, Cristiano Ronaldo etinyela aka n'akwụkwọ ịgbara ndị otu egwu bọọlụ Juventus nke Italy.

Ronaldọ si na obi dị ya ụtọ ịbata Juventus ụgbụa ebe ndị ọgbọ ya na aga mba China na Qatar.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Lee ihe nkiri anyị