Nwodo: Biafra agaghị abịa site n'ọgụ

John Nnia Nwodo bụ onyeisi Ọhanaeze ndigbo n'ụwa niile akpọkuela ndị na-achọ nwereonwe Biafra dịka Mba ka ha minye nma n'abọ n'ihe gbasara ọgụ Biafra.

Nwodo kwuru nke a mgbe ọ na-ekwu okwu na ọgbakọ mmụta ihe ndị ụmụakwụkwọ Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka, Enugu Steeti.

O kwuru na nnwereonwe Biafra abụghị site n'ịlụ ọgụ, esemokwu maọbụ ịkparị ndị mmadụ ọkachasị ndị nọ n'ọchịchị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

"Anyị agaghị enweta Bịafra site n'ịlụọgụ na ịkparị ndị mmadụ, anyị agaghị edọzi obodo site n'itimkpu, anyị ga-enweta ya site n'usoro ndọrọndọrọ. na-ikwu eziokwu." Nwodo kwuru.

Na nzaghachị, mgbe BBC Igbo gbara onye ọdeakwụkwọ ndị Ipob bụ Emma Powerful ajụjụọnụ, o kwuru na ihe ha chọrọ bụ ntuliaka nwereonwe nke akpọrọ 'Referendum' n'asụsụ Bekee na ọ bụghị ọgụ.

O kwuru na ọ bụ ihe ihere na onye dịka Nnia Nwodo bụ onyeisi ndigbo ga-ekwu ụdị okwu a.

Powerful kwuru na ọ bụ Nwodo kpara nkata mere ndị agha Naịjirịa jiri wakpo ụlọ onye ndu Ipob bụ Nmamdi Kanu ma gbuo ọtụtụ ndị Ipob nke mere na-amaghị ebe Nnamdị nọ ruo taa.

BBC Igbo gbara mbọ ị nweta Nnia Nwodo n'ekwentị, ka ọ zara ọnụ ya n'ihe Emma Powerful kwuru gbasara ya, mana ọ zaghị.

Gee ihe Emma Powerful kwuru ebe a;