You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Buhari na ndị ndu ụlọomeiwu kparịtara ụka nzuzo n'abalị
Akụkọ ekwuola na Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari na ndị isi ọgbakọ omeiwu ukwu na nke nta nwere mkparịta ụnyaahụ, 15 Maachị 2018 n'ụlọ ọnyeisiala mgbe ojiri obere oge gafee elekere itoolu nke abalị.
Onyeisi ndị omeiwu ukwu bụ Bukọla Saraki n'akwa ogbo ya bụ Yakubu Dogara du ndị ọzọ mee ya bụ njem.
Ha nọrọ ihe ruru otu elekere na ya bụ ọgbakọ nke amatabeghị isi okwu ya.
Cheta na nke a na-eme ka Onyeisiala Buharị jụrụ itinye aka n'akwụkwọ ndị ụlọomeiwu degara ya maka imegharị usoro ntuliaka nke bekee kpọrọ "Electoral Act amendment Bill".
Ndị ọzọ nọ na ya bụ ọgbakọ nzuzo bụ Ahmed Lawan, onye ndụ ndị Sịnetị, Lasun Yusuf, osote onyeisi ụlọomeiwu nke nata, Femi Gbajabiamila, onyeisi ụlọ nzụkọ, na Sola Adeyeye.
Ndị ọzọ bụ Al-Hassan bụ Chif Wip nke ụlọomeiwu n'ọkwa na ogbo osote ya bụ Pally Iriase: Philip Aduda nakwa ndị ọzọ.