Dino Melaye: Onye omeiwu ukwu etiela egwu ọzọ

Dino Melaye

Ebe foto si, Facebook/Dino Melaye

Nkọwa foto, Dino Melaye bụ ezigbote onye nkwado onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ onye ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua na soshal midia Naịjirịa bụ na Sinetọ Dino Melaye etiela egwu ọzọ.

Melaye bụ onye omeiwu a ma ama maka ịgụ egwu banyere ihe ọbula ọ na-agabiga, gụru egwu ọzọ na nke o ji na-eto pati ọ nọbu bụ Peoples Democratic Party (PDP), na-asị na ọ chọrọ ịlagachị ebe ahụ.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Egwu ọ gụrụ bụ egwu eji mara ụmụakwụkwọ, mana Melaye gụgharịrị ya.

Egwu Melaye a na ihe ọ pụtara - ịlagachị PDP - abụghị ihe na-atụ ndị mmadụ n'anya makana ọ na-agụbu egwu na mbụ, nakwa ndị mmadu na-echebu na o so n'ime ndị ga-eso na ndị ahụ kewapụrụ na All Progressive Congress (APC), bu ndị a kpọrọ R-APC.

N'ọnọdụ ahụ, egwu ya nwereike ịbụ ihe o ji egosi na ọ lagachịla PDP.

Ndị mmadụ na Twitter na-etinye ọnụ n'ihe Melaye mere. Ka ụfọdụ na eto ya, ndi ọzọ na-akatọ ya.

Gere ha ntị:

Onye nwe akara @osatcom jụrụ, "Ọ bụ gịnị ka anyị mere anyị ji enweta udịrị ndị ọchịchị dị otua?"

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@Yobe_Things sara ya sị, "O si n'aka ọha na-agbara ndị na-achị ha akaebe ma ha mehie."

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

@hurssle n'onwe ya kwuru na ndị ọchịchị obodo ahụ dị ka ndị na-akpa ọchị, ma kwuo na udịrị ndị ọchịchị dị na Naịjirịa na-egosi na mba ahụ bụ ihe ọchị.

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

@peterukp kwuru na ya enweghi ike ịkpọ Melaye asị, makana o so na ndị ụbụrụ ha dị ọkụ n'ọrụ ọmeiwu. O kwukwara na enweghi ihe dị n'omume Melaye ga-egbochi ya ịnọchịte anya ndị be ya.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

N'okwu dị ka o mere ka nlaghachị Melaye na PDP bụrụ eziokwu, @officialkolaO bụ onye odeakwukwọ mgbasaozi nke PDP kelere Melaye ma sị ya nnọọ.

Skip X post, 6
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 6

Ka ọtụtụ mmadụ na-ekwu na Melaye na ndi ọzọ (aha Bukola Saraki, bụ onyeisi ndị omeiwu Naịjirịa, so na ya) nke ahụ abụbeghị ihe edere n'okwute makana ndọrọdọrọ ọchịchị na ndị na-eme ya na-enwe ka ọ na-adị. Ka ndị Igbo na-ekwu "echi dị ime".

Nke bụ eziokwu bụ site n'etu ndị mmadụ siri mara ya, opụpụ mmadụ dị ka Melaye na APC nwere ike mee ka ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019 taa pati a na-achị akpụ karịa ma ọ bụrụ na ọ pụghị.

Ndị APC enwebeghị ihe ha kwuru maka Melaye, mana ha katọrọ ndị R-APC, ma kwuo na ọ bụ ndị obi adighị mma maka ntuliaka ime ụlọ ha mere iji họpụta ndị ga-achị otu ha mepụtara ya bụ atụmatu ọhụrụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ