You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị Bishop Katọlịk: Oke ogbugbu mmadụ ga-emebiri Buhari ntụliaka 2019
Ọgbakọ ndị ụkọchukwu Katọlịk na Naịjirịa akpọrọ ''Catholic Bishops Conference of Nigeria (CBCN)'' ekwuola na nkiti onyeisiala bụ Muhammadu Buhari gbara maka oke ogbugbu ga-emebiri ya ihe na ntụliaka na-abịa nụ.
O kwuru na ọ bụ eziokwu na onyeisiala na-agba mbọ ole ike ya ha mana ya bụ mbọ ezuchaghị.
Onye ode akwụkwọ ọgbakọ ahụ bụ Fada Evaristus Bassey kwuru na ndị ụkọchụkwụ Katọtọlịk chọrọ ka onyeisiala gee-nti oku ndị mmadụ na-akpọku ya ị wepụ ndị isi ọrụ nchekwa.
Fada Bassey kwuru na ha anaghị etiri onyeisiala iwu kama na ọ bụ ihe ga-enyere ya aka maọbụrụ na ọ kwụsịrịnwụrụ oke ogbugbu na-eme n'ala Naịjirịa.
N'ọnụ ya,''ọ bụrụ na onyeisiala enweghị ike ị ikwụsịnwụ oke ogbugbu a, anyị na kpọku ya dịka onye kwesiri ezigbo ugwu ka o tinye akwụkwọ alụkwaghịm ma ya bụrụ na ọ zọrọ ndụ ndị mmadụ.''
O kwukwara na uche na-eche ha ma etu ihe sị dị ugbua a ga-enwe ntukliaka kwụọtọ, na agbakwunye na ọ bụ INEC ka ọdịrị ime ka vootu ndị mmadụ ghara ị bụ ihe efu.
Cheta na ndị Ụkọchukwu Katọlik a akpọrọ CBCN mere ọgbakọ ụnyahụ ebe ha depụtara akwụkwọ na-egosi iwe ha maka oke ogbugbu na-eme Naịjirịa.
Ha bokwara ndị uweojii ebubo na ha na-eme iru mma abụọ ma ha chopụta na ọ bụ ndị ochị ehị mejọrọ na mwakpo ọ bụla.