Akụkọ kachasị na-abalịa a: ntụlịaka nwereonwe ga-amalite-Ipob
Ipob si na ntuliala nnwereonwe eruola

Ebe foto si, Getty Images
Otu Ipob ekwuola na ha ebidola biwe akwụkwọ mbinyeaka maka ntuliaka referandum.
Ọnụ n'ekwuru ndị otu a bụ Emma Powerful gwara BBC na nke a bụ agba mbụ n'ime agba atọ maka ntuliaka nnwereonwe Biafra nke o kwuru ga- eme na ngwụcha afọ.
A chụọla onyenkuzi OAU maka ebubondina maka ịgafe ule

Ebe foto si, OAU/fb
Onyeisi Obafemi Awolowo University, Ile-Ife dị n'Ọsun steeti bụ Eyitope Ogunbodede, kwupụtara na mahadum ahụ achụọla onye nkụzị ha bụ Prof Richard Akindele, maka ịrịọ nwa akwụkwọ ya ndina iji mee ka ọ gafee n'ule.
Onyeisiala Buhari ebinyelaka na akwụkwọ mkpata na mmefu akụ maka afọ 2018

Ebe foto si, Buhari/Twitter
Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyela aka na Bọjeti afọ 2018 n'obi gọọmentị n' Abụja taa.
Dịka ọ na eme nke a Buharị kwara arịrị na ndị omeiwu sepuru ihe n'ego ehiwere maka ọrụ dị oke mkpa nke gụnyere ịrụ ọdọ ụgbọelu n'Enugwụ.
Ndị ọnụ na-eru n'okwu sị Trump ekwuola arụ

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Ndị mba ụwa agbakọla aka katọọ atụmatụ onyeisiala Trump ikewa ezinaụlọ site na iwu e ji abata mba US.
Onyeisiala mba UK bụ Theresa May na Pope Francis bụ ndi so kwuo nke a, sịrị na ya bụ amụma jọgbụrụ udele ma sigbuo nkakwụ.
N'egwuruegwu,

Ebe foto si, EPA
N'egwuruegwu taa, Moroko abụrụla mba mbụ si Afrịka agbapụrụ na Iko mbaụwa na Rọshịa.
Ronaldo tinyere otu goolu na nkeji anọ amalitechara ya bụ egwuruegwu mgbe ha na Pọtụgal kwatara n'ehihie a.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri anyị












