Gọọmenti akwadola ka ndị ọrụ nchekwa tinye anya ịkwusi okwu asi na igwe okwu ọhụrụ

Ebe foto si, @BashirAhmaad
E nyere iwu a na nzukọ nchekwa nke onyeisi ala Naijiria bụ Muhammadu Buhari nọ n'isi ya nke e mere n'ụlọ gọọment n'Abuja ụbọchị ịrịabụọ na ise nke ọnwa Jenụwarị, 2018.
Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa bụ Mansur Dan Ali onye nke gwara ndị ntaakụkọ nke a ka emechara nzukọ ahụ kwuru na okwu asị na-abawanye n'ala Naijiria.
Ali sịrị: "Ndị ọrụ nchekwa obodo kwesịrị ileba anya na mgbasa ọkwu asi na social media ọkachasị nke ndị Naijiria nwere agba."
Ndị bara nzukọ ahụ gụnyere; onye isi nchekwa (Chief of Defence Staff) bụ Generalụ Gabriel Olonisakin, onyeisi ndị agha (Chief of Army Staff) Lt. Gen Tukur Buratai, na onye isi ndị agha ụgbọ-elụ (Chief of Air Staff), Air Marshall Sadique Abubakar.
Ndi ọzọ bụ onye-isi ndị agha ụgbọmmịrị ( Chief of Naval Staff) Vice Admiral Ibok-Ete Ekwe Ibas, na onye isi ndị uwe ojii, (Inspector-General of Police), Ibrahim Idris.
Ali kwupụtakwara na nzụkọ ahụ lebara anya n'ihe kpatara ọgbaghara dị na etiti ndị na-achị ehi na dnị ọrụugbo nke o boro mmechi e mechiri ọwa ndị na-achị ehi ya na iwu megidere ịchịghari ehi nke ụfọdụ steeti mere ya na ndị nche ime obodo.




