Ogbunigwe agbaala n'ime ụlọụka n'Enugwu steeti

Ụfọdụ mmadụ n'obodo Iji-Nike kọwara ka ha siri nụ ụda ihe ha chere na ọ bụ ogbunigwe n'obodo ha ụnyaahụ.

Ogbunigwe ahụ gbara n'ime ụlọụka Holy Cross Catholic Church dị n'obodo ahụ ihe dịka Elekere ise nke ụtụtụ mara ebe niile jijiji mana o nweghi onye nwụrụ.

Fada Emmanuel Okwor bụ ụkọchụkwụ na-achịkọta ụlọụka ahụ kwuru na ihe a mere mgbe ọ na-akwado idu mass n'ụtụtụ ụbọchị ụka.

Ọ sị "nke a butere ọgbaaghara ma me kwa ka ụfọdụ ndị mmadụ gbapụ ọsọ ga zoo onwe ha".

Bishọpụ Enugwu bụ Callsitus Onaga agaala ebe ihe a mere ma na-ekwu na nke a kwesiri i mee ka onye ọbụla kpachara anya ha.

Ọ sị na ọ bụrụ na ihe a mere mgbe ndị mmadụ nọ n'ụlọọka na ọ kara ibute nsogbu ebe ndị mmadụ na-agba ọsọ.

Akụkọ ka na-abịa.